CAF 2019: Naịjirịa ejirila Burundi taa atụ ụtụtụ

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Otu Super Eagles nke Naịjiria azarala aha nna ha dịka ha ji mmeri mepe asọmpi iko mba Afrịka nke 2019.

Ọ bụ na nkeji 77 ka Ighalo jiri otu ọkpụ dọka neeti ndị Burundi.

Mba Burundi nwara ike ha ị sata goolu ahụ mana ọ mịtaghị mkpụrụ na ngwụcha asọmpi ahụ.

N'ime ihe a niile otu onye aha ya na-ewu ewu bụ Samuel Chukwueze dịka ọ gosiri onwe ya n'asọmpị a.

Cheta na Samuel Kalu esoghi ibe ya gbaa bọọlụ taa dịka o koropuru ụnya ahụ mgbe ha na-eme nkuzi.

Lekwa ozi Kanu Nwankwo ziri ndị Super Eagles tupu ha ezute mba Burundi.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post