Presidential Election 2019: 'Ụzọ atọ azịza si zapụ ncheanwụ n'ụzọ oche onyeisiala'

Buhari na Atiku

Ọ bụghịzị ihe ọhụrụ na ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec ekwuola na ọ bụ Muhammadu Buhari bụ onye ga-achị Nigeria n'afọ anọ ga-abịa.

Mana okwu a ka bụ ihe na-akpọtụ na Naịjirịa ugbua.

Atiku Abubakar bụ onye ya na Buhari zọrọ ọchịchị onyeisiala, kwuru na ya anabataghi ihe Inec kwuru.

Ka o sila dị, Immanuel James Ibe-Anyanwu bụ onye ọnụ ya na-eru n'okwu banyere obodo, gwara BBC na n'agbanyeghị na onyeisiala Muhammadu Buhari emeriela, ihe bụ isiokwu ugbua bụ ụzọ o si merie.

Lee ihe Ibe-Anyanwu sị mere Buhari jiri merie Atiku:

1) Atiku họtara onye Igbo ka ọ bụrụ osote ya:

Peter Obi

Ebe foto si, Getty Images

Ibe-Anyanwu sị na otu ihe mere ka Atiku daa bụ makana onye ọ họtara ka ọ bụrụ osote ya bụ Peter Obi bụ onye Igbo.

Ọ sị, "Ọ bụrụ na ọ bụghị onye Igbo bụ osote ya, Buhari agaghị emerinwu ya."

Nkọwa ya bụ na ọ bụ achọghị ndị Igbo n'ọchịchi mere ndị mmadụ ejighi tinyere Atiku.

2) Ndị mmadụ apụtaghị ịtụ vootu ka o kwesịrị.

"Ndị natara akwụkwọ ntuliaka dị nde iri asaa na abụọ na ụma, mana ndị tụrụ vootu bụ naanị nde iri abụọ na asatọ na ụma," Ibe-Anyanwu kwuru.

Ma tinyekwa na ya bụ ihe na-agbawa obi dịka ndị Naịjirịa ekwesịghi i na-eme etu a.

3) Ntuliaka a agaghi nke ọma ma:

Akụkọ Igbo

Ibe-Anyanwu sị na ihe ọzọ bụ na ntuliaka a nwere ọtụtụ ọghọm, dịka amaliteghi n'ọge, mpụ na nrụrụaka mere n'ụfọdụ ebe, nakwa ọgbaghara na ogbugbu mmadụ, so n'ihe mere mmeri jiri raa Atiku ahụ.

Ibe-Anywanwu gara n'ihu sị na n'agbanyeghi na ndị mmadụ chọrọ ka ntuliaka nke a gaa ọfụma karịa nke 2015, ọ bụghi ihe a ka a hụrụ, n'uche ya.

Akụkọ ga-amasị gị