Oke ụgwọ ọnwa gị oruru nke Sịnetọ?

Etu e si eme ya
Otu sinetọ Naịjirịa na-erite ihe ruru nde 156 kwa afọ.
Ọ bụrụ na ị na-erite ụgwọọnwa ọpekata mpe (₦18,000):
- Ọ ga-ewe otu sinetọ otu elekere na otu nkeji iji rite ụgwọọnwa gị.
- N'ụgwọọnwa gị ugbua, ọ ga-ewe gị ihe ruru afọ 722 na ọnwa atọ iji rite ụgwọọnwa onye sinetọ na-erite kwa afọ.
- Ọ bụrụ na ị bidoro ịrụ ọrụ n'afọ 1296, ị gaara enwe ike ịchụkwudo ha ugbua.
- Ụgwọọnwa otu sinetọ ga-azụtanwu akpa osikapa 866, ebe ụgwọọnwa gị ga-azụtanwu otu akpa osikapa.
Ọ bụrụ na ị na-erite ₦50,000:
- Ọ ga-ewe otu sinetọ elekere abụọ na nkeji 49 iji rite ụgwọọnwa gị.
- N'ụgwọọnwa gị ugbua, ọ ga-ewe gị ihe ruru afọ 260 iji rite ụgwọọnwa otu sinetọ na-eri kwa afọ.
- Ọ bụrụ na ị bidoro ịrụ ọrụ n'afọ 1758, ị gaara enwe ike ịchụkwudo ha ugbua.
- Ụgwọọnwa otu sinetọ n'ime otu ọnwa ga-azụtanwu akpa osikapa 866, ebe ụgwọọnwa gị ga-azụtanwu akpa osikapa atọ
Ọ bụrụ na ị na-erite ₦100,000:
- Ọ ga-ewe otu sinetọ elekere ise na nkeji 37 iji rite ụgwọọnwa gị.
- N'ụgwọọnwa gị ugbua, ọ ga-ewe gị ihe ruru afọ 130 iji rite ụgwọọnwa otu sinetọ kwa afọ.
- Ọ bụrụ na ị bidoro ịrụ ọrụ n'afọ 1888, ị gaara achụkwudo ha ugbua.
- Ụgwọọnwa otu sinetọ n'ime otu ọnwa ga-azụtanwu akpa osikapa 866, ebe ụgwọọnwa gị ga-azụtanwu akpa osikapa isii
Ọ bụrụ na ị na-erite ₦150,000:
- Ọ ga-ewe otu sinetọ elekere asatọ na nkeji 26 iji rite ụgwọọnwa gị.
- N'ụgwọọnwa gị ugbua, ọ ga-ewe gị ihe ruru afọ 86 na ọnwa asatọ iji rite ụgwọọnwa otu sinetọ kwa afọ.
- Ọ bụrụ na ị bidoro ịrụ ọrụ n'afọ 1931 ị gaara emechawala, ị gaara achụkwudo ha ugbua.
- Ụgwọọnwa otu sinetọ n'ime otu ọnwa ga-azụtanwu akpa osikapa 866, ebe ụgwọọnwa gị ga-azụtanwu akpa osikapa iri.
Ọ bụrụ na ị na-erite ₦200,000:
- Ọ ga-ewe otu sinetọ elekere 11 na nkeji 14 iji rite ụgwọọnwa gị.
- N'ụgwọọnwa gị ugbua, ọ ga-ewe gị ihe ruru afọ 65 iji rite ụgwọọnwa otu sinetọ kwa afọ.
- Ọ bụrụ na ị bidoro ịrụ ọrụ n'afọ 1953 ị gaara emechawala, ị gaara achụkwudo ha ugbua.
- Ụgwọọnwa otu sinetọ n'ime otu ọnwa ga-azụtanwu akpa osikapa 866, ebe ụgwọọnwa gị ga-azụtanwu akpa osikapa 13.
onye mere ya
Olawale Malomo mepụtara nke a ebe Manuella Bonomi mere eserese ya
Etu e si eme ya
Ihe e ji mee atụmatụ ụgwọọnwa ndị sinetọ sitere n'okwu Sinetọ Shehu Sani kwuru, bụ otu n'ime ndị sineeti Naịjirịa n'ụbọchị Maachị 7, 2018. Ego ole ndị sinetọ na-eri n'ụgwọọnwa adịghị n'ebe ọha na-ahụ ya anya ugbua.
N'ụbọchị Maachị 20 2018 e jiri http://xe.com gbanwee ego n'ọnụ 1USD=359.200NGN, , 1GBP = 503.483NGN
Ihe mgbakọ were ya na otu akpa osikapa ga-abụ ₦15,000
























