Akụkọ kachasị n'abalị a: Donald Duke agụnyela na ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na 2019
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a:
Osote onyeisiala mezuru ọchịchị onyeisi ya agaghị azọlizi ọkwa onyeisiala karịa otu ugboro.

Ebe foto si, Muhammadu Buhari/ Facebook
Onyeisiala Muhammadu Buhari ebinyela aka n'iwu na-akwụsị osote onyeisila ịzọ ọkwa ọchịchị onyeisiala karịa otu ugboro ma ọbụru na o mezuru ọchịchị onyeisiala ya.
Nke a pụtara na onwere ihe mere onyeisiala jiri pụọ n'ọchịchị n'oge na-erughi eru, osote mezuo oge ọchịchị ya, ọ gaghị azọli ọkwa onyeisiala karịa otu ugboro.
Naịjirịa
Donald Duke esonyela n'ọsọ ọkwa onyeisiala.

Ebe foto si, Donald Duke/ Facebook
Aka chịburu Cross River steeti bụ Donald Duke ekwupụtala ebumnobi ya ịzọ ọkwa ọchịchị onyeisiala n'afọ 2019.
O kwupụtara ebumnobi ya n'Anambra steeti ụnyaahụ ebe ọ gara ịgwa ndị ọkaiwu okwu.
Ebe ọzọ na Naịjirịa
Onyeisiala Buhari ga-aga Moroko echi.

Ebe foto si, NGR President/ Twitter
Onye nkwuchite ọnụ onyeisiala bụ Garba Shehu kwuru na onyeisiala Moroko bụ Eze Mohammed nke isii bụ onye kpọrọ ya ka ọ bịa.
Akụkọ mba ofesi
Trump esila n'ọgbakọ G7 pụọ.

Ebe foto si, Getty Images
Donald Trump ahapụla ọgbakọ G7 na-eme na Kanada gawa Singapore.
Ya na ndị mba ọzọ na-akwata ya maka ihe gbasara azụmahịa n'etiti ha.
N'egwuregwu,
Ndị Super Eagles nwere onye ọbịa nọnyere ha ebe ha na-akwado asọmpi Iko Mbaụwa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Nwafọ Naịjirịa na-agbara mba Ọstrịa bọọlụ bụ David Alaba gara hụụ ndị Super Eagles ebe ha nọ akwado asọmpi Iko Mbaụwa.
Alaba kelere ndị Naịjịrịa maka nkwado ha na-akwdo ya ma kpekwara ndị Super Eagles ekpere mmeri.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:





























