Ụlọikpe majie ezigala Anthony Onyeukwu ụlọnga maka ebubo igbu nwatakịrị n’Enugwu Steeti
Ụlọikpe majie dị n’okpuru ochichi Enugwu East, Enugwu steeti ezigala otu nwoke aha ya bụ Onyeukwu Anthony ụlọnga maka ọnwụ nwata nwoke aha ya bụ Goodluck John.
Goodluck John gbara afọ iri abụọ na otu (11) bụ onye enyemaka Anthony Onyeukwu.
Kọmịshọna na ahụ maka ụmụaka na mmepe obodo n’Enugwu steeti bụ Ngozi Enih kwuru na “Ndị uweojii wuchiri Anthony Onyeukwu gbara afọ 47 oge ama ọnwụ nwata nwoke ahụ gbara nke sitere na mkpagbu, iti ihe na ajọ ọnọdụ e tinyere na ya".
Ngozi Enih kọwara na 'Oge Goodluck nwụrụ, Onyeukwu jị ọsọọsọ mee ka e tinye ozu ya n’ala n’obodo ya dị n’Abia steeti ma ghara ime ka ngalaba gọọmenti obula mara maka ya.
Ọ gara n'ihu kwuo na Anthony gwara ezinaụlọ nwa amadị ahụ na nwa ha nwoke nwụrụ n'ụlọọgwụ Parklane dị n’Enugwu, mana nnyocha e mere gosiri na enweghị oge ọbụla e butere Goodluck n’ụlọọgwụ ahụ maọbụ tinye ozu ya n’ọbaozu ụlọọgwụ ahụ.
Onye uweojii kpụpụrụ Onyeukwu Anthony n’ụlọikpe gwara majie ahụ na Anthony dara iwu megidere Enugwu steeti.
E boro ya ebubo igbu Goodluck John gbara afọ iri na otu n’abalị 15 Ọktoba, 2024 n'ụlọ ya dị na No. 4, Mike Onyeka Close, Loma Linda Extension, Maryland, Enugwu”.
Ka Ụlọikpe majie nuchara ikpe ahụ, o zigara Onyeukwu Anthony n’ụlọnga ma nyigharia ikpe ahụ ụbọchị Wenezde 20 Nọvemba, 2024.