You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ukraine ịbanye NATO agwụla ihe ga-akwụsị agha dị n’etiti anyị na Russia - Zelensky

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Nọvemba 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ụlọikpe majie ezigala Anthony Onyeukwu ụlọnga maka ebubo igbu nwatakịrị n’Enugwu Steeti

    Ụlọikpe majie dị n’okpuru ochichi Enugwu East, Enugwu steeti ezigala otu nwoke aha ya bụ Onyeukwu Anthony ụlọnga maka ọnwụ nwata nwoke aha ya bụ Goodluck John.

    Goodluck John gbara afọ iri abụọ na otu (11) bụ onye enyemaka Anthony Onyeukwu.

    Kọmịshọna na ahụ maka ụmụaka na mmepe obodo n’Enugwu steeti bụ Ngozi Enih kwuru na “Ndị uweojii wuchiri Anthony Onyeukwu gbara afọ 47 oge ama ọnwụ nwata nwoke ahụ gbara nke sitere na mkpagbu, iti ihe na ajọ ọnọdụ e tinyere na ya".

    Ngozi Enih kọwara na 'Oge Goodluck nwụrụ, Onyeukwu jị ọsọọsọ mee ka e tinye ozu ya n’ala n’obodo ya dị n’Abia steeti ma ghara ime ka ngalaba gọọmenti obula mara maka ya.

    Ọ gara n'ihu kwuo na Anthony gwara ezinaụlọ nwa amadị ahụ na nwa ha nwoke nwụrụ n'ụlọọgwụ Parklane dị n’Enugwu, mana nnyocha e mere gosiri na enweghị oge ọbụla e butere Goodluck n’ụlọọgwụ ahụ maọbụ tinye ozu ya n’ọbaozu ụlọọgwụ ahụ.

    Onye uweojii kpụpụrụ Onyeukwu Anthony n’ụlọikpe gwara majie ahụ na Anthony dara iwu megidere Enugwu steeti.

    E boro ya ebubo igbu Goodluck John gbara afọ iri na otu n’abalị 15 Ọktoba, 2024 n'ụlọ ya dị na No. 4, Mike Onyeka Close, Loma Linda Extension, Maryland, Enugwu”.

    Ka Ụlọikpe majie nuchara ikpe ahụ, o zigara Onyeukwu Anthony n’ụlọnga ma nyigharia ikpe ahụ ụbọchị Wenezde 20 Nọvemba, 2024.

  2. NLC ga-ebido ịgba abụbụọrụ na steeti ndị anaghị akwụ ụgwọ opekatampe ọhụrụ

    Otu jikọtara ndị ọrụ Bekee na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) agwala ndị otu ha nọ na steetị ndị na-amalitebeghi ịkwụ pụkụ naịra iri asaa ka ha bido gbawa n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Disemba 2024.

    Ntuziaka a dị mkpebi ha mere n’ọgbakọ ndịisi otu nwere na ngwụcha izuụka.

    “Ọ bụ ihe mwute na ọtụtụ ndị gọvanọ steeti na-egbu oge n’ịmalite ịkwụ ndị ọrụ anyị ụgwọ opekatampe ọhụrụ. Nke mmegbu nakwa ịnapụ ndị ọrụ Bekee oke ruuru ha na-agbanyeghi ọnọdụ isi ike dị n’obodo ugbua. Nke a bụ ileghara iwu anya nakwa itinye ndụ otụtụ nde ndị Naịjirịa n’ihe ọghọ bụ nke ndị ndu kwesịrị ichekwa ha na-eme.

    “N’ihi nke a anyị kpebiri ihiwe kọmitii na-ahụ maka ịkwụ ụgwọ opekatampe ọhụrụ a na Naịjirịa, ha gaa na-ekpokọta ndị ọrụ Bekee ma na-akụziri ha mkpa ọdị ịgba isi akwara megide ihe ọbụla na-akpagbu ikike dịịrị ha.

    “Na ngwụcha, steeti niile gọọmentị ya amalitebeghi kwụwa ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ruo na ngwụcha ọnwa Nọvemba a, e nyela ndị ọrụ ikike ka ha malite abụbụọrụ n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Disemba 2024.”

    Ndị otu a gara n’ihu kwuo na e kwesịrị inye ndị ọrụ ikpe ziri ezi, na ha ga-enwete ya.

  3. Ụtụtụ ọma nụ ooo!

    Anyị na-anabata gị n'izuụka ọhụrụ na-asị ka ọ maara gị na mma.

    Biko gbalịa na-anọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

  4. A nwụchiela mmadụ isii na-agba mgbere ọgwụ ike

    Ụlọọrụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) awuchiela mmadụ isii (6) na-atụ mgbere ọgwụ ike.

    Ozi ọnụ na-ekwuru NDLEA bụ Femi Babafemi wepụtara kwuru na ihe ha nwetara n’aka mmadụ isii ahụ awichiri si Anambra, Adamawa, Legọs nakwa mba Kamerunu egụnyere ọgwụ ike koken nakwa opiods ọnụego ya ruru ọtụtụ ijeri naira.

    Ọ gara n’ihu kwuo na o meela ọtụtụ ọnwa ụlọọrụ NDLEA ji na-achọ ndị otu ahụ bụ ndị a na-eyo eyo na-enye ndị na-eyi ọha egwu na Naịjirịa na Kamerunu ọgwụ ike.

    Aha ndị ahụ ha wuchiri gụnyere Ibrahim Bawuro, Najib Ibrahim, Ibrahim Umar, Nelson Anayo, Ezeh Martin na Adejumo Ishola.

  5. Ogbunigwe Isreal tụrụ n'ụlọobibi dị na Gaza egbuola ọtụtụ mmadụ

    Ọtụtụ ndị mmadụ anwụọla ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ n’ogbunigwe mba Isreal tụrụ n’ụlọ obibi dị na mpaghara Jabalia nke Gaza dịka ndị ọrụ ahụike Palestine si kwuo.

    Ụlọọrụ mgbasaozi Palestine Wafa nakwa otu nchekwa Gaza kwuru na e gburu ihe ruru mmadụ iri atọ, ha kwuru ndị a nwụrụ gụnyere ụmụaka 13.

    Ndịagha mba Isreal kwuru na ha tụrụ ogbunigwe na Jabalia n’ogige ebe ndị oyi ndụ egwu na-akpa ike. Ha kwuru na ha gbara mbọ ibelata etu ọ ga-esi metụta ndị nkịtị.

    Ndị ọrụ enyemaka kwuru na Jabalia na mpaghara ndị ọzo nọ n’Ugwu Gaza ahụtala nnukwu mwakpo kamgbe ọnwa Ọktoba Isreal malitere mwakpo ọzọ megide otu Hamas.

    Isreal nwere iwu mmachi na-eche ha n’ihu site n’aka mba Amerịka nke sị ka ha wulite ọnọdụ ọdịmma ndị mmadụ na Gaza maọbụ e machie ha.

    Otu dọkịta na-arụ n’ụlọọgwụ AL-Ahly dị na Gaza gwara ndị ntaakụkọ AP na ụlọọgwụ ha anatala ozu mmadụ 17 si na Jabalia nke gụnyere ụmụnwaanyị itoolu dịka a na-atụ anya na ọnụọgụgụ nwereike ịkarị.

    Anya hụrụ ka ihe a jiri mee kọwara mwakpo Isreal mere n’ụlọ e sị bụ nke ezinaụlọ Alloush dịka ‘ala ọmajijiji.”

  6. Onyeisiala Tinubu awụchiela Saudi Arabia maka ọgbakọ 'Joint Arab-Islamic Summit'

    Onyeisiala Tinubu tụrụ ụkwụ n’obodo Riyadh nke mba Saudi Arabia n’ụtụtụ Sọnde maka ọgbakọ ‘Joint Arab-Islamic Summit’.

    Ọ kwụsịrị n’ọdọụgbọelu King Abdulaziz n’elekere iri nke ụtụtụ ebe osote gọvanọ Riyadh bụ Ọkparaeze Mohammed Bin Abdulrahman Bin Abdulaziz nabatara ya.

    Onyeisiala Tinubu mere njem a site n’oku Eze Salman bụ Ọkparaeze Mohammed bin Salman kpọrọ ya.

    A na-atụ anya na Onyeisiala Tinubu ga-etinye ọnụ n’ọgbaghara na-ada n’etiti mba Isreal na Palestine ebe ọ ga-arụtụ aka n’oku Naịjirịa na-akpọ sị ka onye ọbula mịnye mma ya n’ọbọ ka e nwee ike mee udo.

    Ọgbakọ a ga-amalite echi bụ Mọnde 11 Nọvemba 2024.

    Gịnị bụ ọgbakọ Arab-Islamic Summit?

    Join Arab-Islamic Summit bụ ọgbakọ jikọtara mba ndị so n’otu Organisation of Islamic Cooperation (OIC) na mba ndị n’Arab.

    Ọ bụ ọgbakọ ndị mba kwenyere n’okpukperechi Alakụba. Onyeisi n’ọgbakọ ahụ bụ mba Saudi Arabia bụ mba ji ọkwa isioche n’ime otu abụọ ndị a.

    A na-emekaarị ọgbakọ kwa ngwụcha afọ ọbụla n’agbata ọnwa Ọktoba na Nọvemba.

  7. Onyeisiala Tinubu ga-aga ọgbakọ ‘Arab-Islamic Summit' na Saudi Arabia

    Onyeisiala Bola Tinubu ga-ahapụ Naịjirịa n’ụbọchị Sọnde gawa mba Saudi Arabia maka ọgbakọ ndị okpukperechi Alakụba a kpọrọ ‘Joint Arab-Islamic Summit.

    Ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Tinubu bụ Bayo Ononuga kwuru nke a n’ozi o wepụtara.

    O kwuru na ọgbakọ ahụ ga-ebiri ọkụ n’ụbọchị Mọnde 11 Nọvemba, 2024 ebe ha ga-elekwasị anya n’ọgbaghara na-eme na mpaghara ‘Middle East’.

    Onyeisiala Tinubu na-eme njem a site n’oku Eze Salman bụ Ọkparaeze Mohammed bin Salman kpọrọ ya.

    A na-atụ anya na Onyeisiala Tinubu ga-etinye ọnụ n’ọgbaghara na-ada n’etiti mba Isreal na Palestine ebe ọ ga-arụtụ aka n’oku Naịjirịa na-akpọ sị ka onye ọbula mịnye mma ya n’ọbọ ka e nwee ike mee udo.

    Ọ ga-etinye arọ nke kwuru ka e nwee mba ọchịchị abụọ a kpọrọ ‘two-state solution’ iji hụụ na e nwetere udo ga-adị ogologo oge na mpaghara ahụ.

    Ononuga kwuru na Onyeisiala Tibubu agaghị eme njem ahụ naanị ya, na ndị ọzọ ga-eso ya gụnyere Nuhu Ribadu – onye ndụmọdụ na nchekwa; Mohammed Idris – mịnịsta mgbasaozi; Yusuf Tukur – mịnịsta mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ.

  8. Igbo mma mma nụ ooo!

    Anyị ji ụkpa ekele anabata unu n'ụbọchị ụka a.

    Ka ụbọchị taa maara unu na mma.

  9. Lakurawa akpawala mkpamkpa na Kebbi steeti

    E gbuola opekatampe mmadụ iri na ise (15) n’obodo Mera dị na Kebbi steeti oge ọgbaaghara tiwapụrụ n’etiti ndị obodo na otu oyi ndụ egwu ọhụrụ bụ Lakurawa.

    Njinji ahụ jiri n’ụbọchị Fraịde 8 Nọvemba 2024 n’Okpuru ọchịchị Augie dị na Kebbi steeti.

    Ndị hụrụ ka o siri mee kwuru na ndị obodo ahụ chụrụ ndị otu Lakurawa ọsọ oge ha wakporo obodo ahụ mgbe ha na-ekpe ekpere Jumah.

    Ya bụ ọgbaaghara butere ọnwụ ụfọdụ ndị obodo ahụ nakwa ndị otu Lakurawa abụọ.

    Ka o sinadị, ndị ọchịchị ezigaala ndị uweojii n’obodo ahụ iji weghachi udo.

    Isi ụlọọrụ nchekwa Naịjirịa kwuru okwu gbasara nhiwe otu oyi ndụ egwu ọhụrụ ahụ n’izuụka gara aga.

    Ha kwuru na Lakurawa malitere na mba Nijie Rịpọblik oge ndịagha kwatuchara ọchịchị onye kwuo uche ya na mba ahụ.

    A na-ekwu na Lakurawa nwere ihe jikọtara ya na otu ISIS na-akpa ike ọjọọ na mpaghara Sahel.

  10. Enweghị iwu megidere ikpe ụmụaka ikpe na Naịjirịa - Ọkaikpe kachasị

    Lateef Fagbemi bụ Ọkaikpe kachasị nakwa Minista ikpe ziri ezi na Naịjirịa ekwuola na enweghị iwu ọbụla megidere ikpe ụmụaka ikpe na Naịjirịa.

    O kwuru nke a n’Abụja oge ya na ndị ntaakụkọ na-enwe mkparịtaụka gbasara iwu ụlọikpe nyere na nso nso a ka a tọhapụ mmadụ otu narị na iri na anọ (114) gụnyere ụmụaka ndị uweojii nwụchiburu ma kpụpụ n’ụlọikpe maka ime ngagharịiwe #EndBadGovernance.

    Fagbemi sịrị “ka m ji ohere a mee ka otu ihe doo anya. Anyị na-eche na n’ihi na ha bụ obere ụmụaka, ọtụtụ mmadụ ekwuola ihe dị iche iche. Enweghị iwu kwuru na agaghị ekpe nwatakịrị ikpe na Naịjirịa.”

    O kwuru na ọ bụghị arụ na a kpụpụrụ ụmụaka sonyere na ngagharịiwe #EndBadGovernance n’Ụlọikpe ukwu etiti dị n’Abụja.

  11. Ọkwọụgbọala Stephen Abuwatseya arịọla Alex Ikwechegh mgbaghara maka ịkpasu ya iwe

    Ọkwọụgbọala ahụ onye omeiwu Alex Ikwechegh yiri egwu ma tie ihe n’ihe onyonyo ahụ fegharịrị n’oge gara aga bụ Stephen Abuwatseya, arịọla omeiwu Alex Ikwechegh mgbaghara maka ịkpasu ya iwe

    Cheta na Stephen Abuwatseya kesara ihe onyonyo ebe Alex Ikwechegh na-anọchiteanya Aba Nọt/Saụt n'ụlọomeiwu nta Naịjirịa, na-eti ya ihe ma yie ya egwu oge ọ gara inwegara ya ihe n’ụlọ ya.

    Mana Stephen Abuwatseya apụtala mee ihe onyonyo ebe ọrịrọ Ikwechegh mgbaghara maka ịkpasu ya iwu.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụ ihe o kwuru kpaliri Alex Ikwechegh nke butere nsogbu ahụ. Ọ rịọrọ biko ka onye ọbụla chefuo ihe ndị ahụ mere.

  12. Lakurawa: Ndị agha achọpụtala otu oyinduegwu ọhụrụ n'ugwu Naịjirịa

    Otu ndị agha Naịjirịa ekwuola na ha achọpụtala otu oyinduegwu ọhụrụ na mpaghara ugwu Naịjirịa akpoọrọ 'Lakurawa'.

    Ha kwuputara na otu ahụ bụ nke ka na-etolite na-enye steeti Sokoto na Kebbi nsogbu.

    Ọnụ na-ekwuru ndị agha bụ Ọchịagha Edward Buba gwara ndị ntaakụkọ nke a na mgbasaozi gbasara ọrụ ndị agha nke e mere n'ụbọchị Tọzde n'Abuja.

    N'otu aka ahụ ha kwuru na ha ji n'aka na otu ahụ agaghị aghọrọ ihe ọbụla maọbụ gaa n'ihu n'ihe ha na-eme maka na ha bụ ndị agha dị njikere ịmemila ha kpam kpam.

    BBC Hausa kọwara na ndị otu Lakurawa ahụ bụ ndị ojiegbe malitere ịwakpo Sokoto na Kebbi ma bụrụ ndị si na mpaghara Sahel Afrịka gụnyere mba Niger na mba Mali bụkwa ndị agbụrụ dị icheiche sikwa n'ebe ahụ.

  13. Mbuze ataala isi mmadụ anọ na Kemerun

    O pekata mpe mmadụ anọ anwụụọla, ebe a na-achọ mmadụ 50 achọ na dịka ụgbọala bu ndị njem na ndị ọrụ ọkporoụzọ ntọrọ n’a mbize tiri na Ndịda Anyanwụ mba Kemerun.

    Ihe mberede ahụ mere n’okporoụzọ nnukwu obodo Duola dị na Kemerun.

    Minista na-ahụ maka ọrụ nam ba ahụ bụ Emmanuel Nganou Djoumessi, kwuru na ọ bụ mgbanwe nke ala nke enweghị mmiri ozizo butere.

    Gọvanọ mpaghara Ọdịda Anyanwụmba ahụ bụ Augustin Awa Fonka kwuru naokporoụzọ mebiri emebi na mpaghara ahụ so n’ihe kpatara mbuze ahụ.

    N’afọ a, Ọdịda Anyanwụ Afrịka nwere nsogbu idemmiri ahụbeghị oyiri ya nke mgbe ọtụtụ afọ nke tara isis ihe karị®ị out puku mmadụ.

  14. Ndị ọrụ nchekwa egbuola mmadu anọ echere bụ ndị ESN n'Enugwu

    Njikọ aka ndị ọrụ nchekwa egbuola mmadụ anọ echere bụ ndị otu ESN bụ otu nchekwa nke Ipob n'Enugwu steeti.

    Njikọ aka ndị ọrụ nchekwa ahụ gụnyere ndị agha, ndị uweojii nakwa ndị ụweojii pụrụiche bụ DSS napụtakwara ndị ahụ ngwa ọgụ dị icheiche dịka mgbọ na egbe.

    Ozi nke si n'aka gọọmentị Enugwu steeti kwuru na ọ bụ mgbe ha nọ n'Eha Alumona dị n'okpuru ọchịchị Nsukka na-akpa nkata ịwakpo Enugu ka ndị ọrụ nchekwa jekwuiri ha na mberede nke mere ka ha malite ịkwa mgbọ.

    Nke ahụ mere ka ụfọdụ ndị ahụ gbabanye n'ime ọhịa dịka ha merụrụ ahụ ebe ha nwụchiri otu onye ọchịagha ndị ESN ahụ.

    Ha kwuru na ọchịagha ahụ kpọpụkwara ha gaa n'ogige ha ebe ha na-ezo ma na-edokọ ngwa agha ha nakwa ihe ndị ọzọ dị icheiche.

    Ozi ahụ kwukwara na ndị ọrụ nchekwa abụọ merụrụ ahụ na mgbọ ahụ akwara nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ ugbua.

    Nke a so na atụmatụ nke Gọọmentị Enugwu steeti hibere iji wụlite nchekwa na steeti ahụ nakwa inyere ndị mmadụ udo gbasara ịgara mkpa ha ọ kachasị n'ụbọchị Monde kama ị nọ n'ụlọ.

  15. Etu ndị ntọrị si tọọrọ Ụkọchukwu Emmanuel Azubuike n'Obollo, Imo Steeti

    Ndịisi ụka Katọlịk akpọọla oku ka e tinye ụkọchukwu Emmanuel Azubuike nke ụlọụka St. Theresa Obollo dị n'okpuruochichi Isiala Mbano, Imo steeti n'ekpere.

    Ndị ntọrị tọọrọ ụkọchukwu ahụ na mpaghara Ajayi dị n'obodo ahụ ka o si ebe ọ gara na-alọta n’ụlọụka ya.

    N’akwụkwọ ozi odeakwụkwọ ụka Katọlịk bụ Princewill Iwuanyanwu dere ma na-arịọ ndị ụka niile ka e tinye ụkọchukwu Emmanuel Azubuike a tọọrọ n’ekpere.

    N'okwu ha “Anyị na-agwa unu niile ka unu tinye ụkọchukwu Emmanuel Azubuike bụ onye a tọọrọ na mgbede Tuzde, Nọvemba 5, 2024 n’elekere isii n’ekpere”.

    “Emmanuel Azubuike bụ onye e chiri ụkọchukwu na Seputemba 27, afọ 2014 bụ ụkọchukwu ndị St. Theresa Katọlịk, Obollo, Isiala mbano, Imo steeti”.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Imo steeti bụ Henry Okonye gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ eziokwu na a tọọrọ ụkọchụkwụ ahụ mana ndị uweojii etinyela usoro ga-enye aka mee ka a nwuchie ndi ntọ ahụ ma gbapụta ụkọchukwu ha ji.

  16. Ndi uweojii n’Imo steeti ekwuola ndị a sị tụrụ ogbunigwe n'Orlu, Imo Steeti

    Ndị uweoji Imo steeti ekwuola ndị ha na-enyo enyo tụrụ ogbunigwe na steeti ahụ nke gburu mmadụ ma meruọ ndị ọzọ ahụ.

    Ọnụ na-ekuru ha bụ Henry Okoye mere ka a mata nke a n’akwụkwọ ozi o wepụtara.

    Dịka Henry Okoye si kwuo “umunwoke abụọ a na-enyo enyo na ha bụ ndị IPOB/ESN bu ogbunigwe ha chọrọ itinye n'ahịa 'Orlu International Market' nke dị nso na Mbari Okporo.

    "Mana tupuu ha eruo ebe ha na-aga, ogbunigwe ahụ gbara ma gbuo mmadụ abụọ ahụ”.

    “Mmadụ abụọ ndị na-agara onwe ha meruru ahụ. Mana e bugara ha n’ụlọọgwụ ebe ha na-anata ọgwụgwọ”.

    Okoye kwuru na ha ka na-eme nyocha ịchọpụta ndị niile aka ha di na mkpamkpa ahụ.

    Kọmịshịọna ndị uweojii n’Imo steeti bụ Aboki Danjuma gara n’ebe ogbunigwe ahụ gbara ma tie ndị meruru ahụ aka n’obi.

    Danjuma kwere ndị ndị Imo nkwa na ha ga-agba mbọ mee ka udiri mkpamkpa a ghara ime ọzọ.

  17. Ụlọikpe akagbuola ebubo niile e boro ụmụaka na ndị ọzọ mere ngagharịiwe maka agụụ

    Ụlọikpe ukwu dị n’Abuja akagbuola ebubo niile e boro ndị mere ngagharịiwe maka oke agụụ na Naịjira.

    Ọkaikpe Obiora Egwuatu wezugara ebubo ahụ niile ma kwụsị ikpe ahụ mgbe ọkaiwu ukwu gọọmentị bụ M.D Abubakar denyere akwụkwọ sị na ha achọghịzị ka e kpee ndị ahụ ikpe.

    Mana na-agbanyịghị na ụmụaka ndị ahụ abịaghị n’ụlọikpe, ọkaikpe kwuru ka e si n’ụlọnga tọhapụ ha.

    Cheta na ọtụtụ n´ime mmadụ 76 ahụ a nwuchiri maka ngagharịiwe bụ ụmụaka na-erubeghị afọ ịrị na ise.

    Na mbụ, ụlọikpe manyere ụmụaka ahụ ego ruru nde naịra iri n’otu n'otu iji gbapụta onwe ha.

    Ego ntọhapụ ahụ butere ọtụtụ nkatọ gbasara etu gọọmenti Naịjirịa sị ekpe ụmụaka ahụ ikpe nakwa ọnọdụ ha n’ụlọnga.

    Mana Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu nọọrọ n'ụbọchị Mọnde nye iwu ka a kwụsị ikpe ụmụaka ahụ.

  18. EFCC anwụchiela Ifeanyi Okowa bụbu Gọvanọ Delta Steeti maka ebubo mpụ ego N1.3trn

    Ụlọọrụ na-ebuagha megide mpụ na nrụrụaka na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) anwụchiela onye bubu Gọvanọ Delta steeti, Ifeanyi Okowa.

    EFCC jidere Ifeanyi Okowa maka ebubo mpụ na imefu ego steeti ahụ ruru otu ijeri naịra na ụma atọ (N1.3trillion).

    Ha nwuchiri Okowa na Portharcourt oge ọ bịara ịzara ọnụ ya maka ebubo ahụ n’ụbọchị Monde n'ụlọọrụ ndị EFCC.

    EFCC na-emekwa ya nyocha maka ebubo dị iche iche ọkachasị nke iji ego steeti ahụ zụọ ọtụtụ ụlọ n’Abuja nakwa itinye ego steeti ahụ n’ụlọọrụ ndị nkịtị n’ụzọ na-adịgjhị n’iwu.

    Ugbua ndị EFCC ka jidere ya n’ụlọọrụ ha dị Port Harcourt.

  19. E nyela iwu ka a tọhapụ ụmụaka ahụ a nwuchiri maka ime ngagharịiwe

    Onyeisiala Bola Tinubu enyela iwu ka a tọhapụ ụmụaka ahụ a nwuchiri ma kpọchie n’ụlọ ndị uweojii maka ime ngagharịiwe.

    Onyeisiala Tinubu gwara Ọkaikpe Ukwu Naịjirịa ka ọ hụ na ụmụaka ahụ niile nweere onwe.

    Ozi Bayo Ọnanuga wepụtara n’aka soshal midia X ya kwuru na Onyeisiala Tinubu nyere misitri na-ahụ maka ndị ụwa na-atụ n’ọnụ iwu ka ha mee ka ụmụaka ahụ lakwuru ezinaụlọ ha dị iche iche.

    Onanuga kwuru na a malitela ime nnyocha iji chọpụta ihe e ji nwuchie ma kpọchie ha n’ụlọ ndị uweojii ọtụtụ ọnwa.

    Nke a na-abịa dịka otu na-ahụ maka ikike dịịrị onye na Naịjirịa bụ Amnesty International gwara Onyeisiala Bola Tinubu ka o nye iwu ngwa ngwa maka ntọhapụ ụmụaka ndị ahụ a kpọpụtara n’ụlọikpe maka ebubo na ha so mee ngagharịiwe.

  20. A na-achọ ndị furu efu dịka idemmiri wakporo Barcelona, Spen

    Ndị ọrụ gbatagbata na Spen na-achọ ndị tọrọ n’okpuru ụlọ ebe a na-adọba ụgbọala na Valencia maka mkpa mkpa idemmiri kpara na mba Spen n’izuụka gara aga.

    A na-atụegwu nd ndị bịara ịzụta ihe nakwa ndị ọrụ tọrọ n’ime ụlọ azụmahịa dị n’Aldaia dị mpụga Valencia dịka idemmiri wakporo mpaghara ahụ.

    Ndị uweojii kwuru na ha ahụbeghị onye ọbụla ihe ahụ metụtara dịka ha nnyochachara ụgbọala iri ise, mana akụkọ kwuru na e nwere ọtụtụ ụgbọala idemmiri ahụ riri.

    Nke a na-abịa dịka ndị ọrụ State Meteorological Agency (Aemet) dọrọ aka na nti ka a ghara ịga na mpaghara Nọt obodo Catalonia n’ihi oke mmiri n’ezo ebe ahụ.

    Isi obodo Spen bụ Barcelona nwere nnukwu idemmiri ụbọchị Mọnde 4 Nọvemba.

    Mmiri abaala n’ọdụ ụgbọelu El Prat ebe a kagbugoro njem ụgbọelu iri asatọ (80) nakwa njem ụgbọoloko.