Kemgbe ụlọọrụ na-ahazị ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Independent National Electoral Commssion (INEC) weputara otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị tozuru ịzọ ọkwa gọvanọ n'Edo steeti, mmadụ atọ kacha ada ụda ma bụrụkwa ndị a kacha kpụrụ n’ọnụ.
Ka onye ọbụla na-echere ka ụbọchị Satọde, abalị iri abụọ n’otu, n’ọnwa Septemba, 2024 rue; ndị na-eme ịchụ nta vọọtụ na-ada ụda gunyere LP, PDP na APC.
Lee ndị ha bụ ma lee ka ha si kwado ya bụ ntuliaka
Olumide Akpata ji ọkọrọtọ otu ọchịchị Labour Patị azọ ya bụ ọkwa.
Olumide dị afọ iri ise na otu.
Ọ bubu onyeisi otu jịkọrọ ndị ọkaịwụ (Nigeria Bar Association).
Olumide kwụsịrị ịzọ ọkwa ọzọ dịka onyeisi NBA n’afọ 2023 ka o nwe ike zọọ ọkwa Gọvanọ Edo Steeti n’afọ 2024.
Ihe kacha mkpa na nkwa Olumide kwere:
-
-Ọ ga-agba mbọ ịhụ na onye ọbụla weta ikpe ziriezi n’ụlọikpe
-Ọ ga-ebuli ọnọdụ ụlọọgwụ, tinye akụrụngwa ọhụrụ ma dozie ngalaba na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata n’ụlọọgwụ.
-Ọ ga-ebuli ego e ji akwado ụlọakwụkwọ na nka na ụzụ nke ga-eme ndị ha zụpụtara na-achọ ọrụ akwụrụ chịmchịm dịka ogbo ha na mba ụwa niile.
-Ọ ga-eme ka usoro ọchịchị gọọmentị bụrụ ihe na-agaghị enwe mkpuchi ma kwụwa aka ọtọ.
Asuerinme Ighodalo ji Peoples Democratic Party dị afọ iri isii na ise.
Ọ bụ onye ọkaịwụ.
Ọ bụ onye ma ihe gbasara azụmahịa, ọ kachasị iwu metutara azụmahịa.
Nkwa kacha mkpa Ighodalo kwere gunyere:
-Ọ ga-enye ndị ruru puku iri ise bụ ndị ihe na-esiri ike ego ruru N20,000 kwa ọnwa.
-Ọ ga-arụ ụzọ ruru 2,000km na mpaghara dị icheiche na steeti ahụ.
-Ọ ga eme ka gburugburu ha dị mma site n’ịkọ osisi ruru 500,000 n’afọ nke mbụ ma bulie ọnụ ọgụgụ osisi ahụ ka o ruo osisi 1,000,000 n’afọ nke abụọ.
-Ọ ga-eme ka ime obodo ruru 500 na steeti ahụ nwee ezigbo mmiri ọṅụnụ
Monday Okpebholo ji ọkọrọtọ ndị APC na-azọ ọkwa gọvanọ n’Edo steetị dị afọ iri ise na atọ.
Ọ bụ onye ji ego achụ ego.
Ugbua ọ bụ sịnatọ na-anọchịta anya ndị mpaghara etiti Edo n’ụlọomeiwu Nịjirịa.
Ihe Okpebholo kwere na nkwa gunyere:
-Ọ ga-ahazị ahụike maka ụmụnwanyị, ụmụaka, ndị rụchara ọlụ bekee, ndị nka.
-Ọ ga-ahazi agụmakwụkwọ site n’ime ka ha nweta ego ịgụakwụkwọ n’efu, itinye anya n’ụgwọ akwụkwọ nakwa inye ndị enweghị ego ohere ịgụ akwụkwọ n’efu.
-Ọ ga-eme ka ndị steeti ahụ site na ndị na-achọ ọrụ ma bụrụ ndị na-enye ọrụ.
-Ọ ga-ahazi ọnọdụ nchekwa sita n’iji Edo state Security Fund were na-echekwa ndị ọrụ ugbo, ndị na-azụ ahịa, ndị ji ego achụ ego na ndị niile bi na steeti ahụ.