You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ụlọikpe Saụt Korịa enyela iwu ka a nwụchie Yoon Suk-yeol a chụpụrụ dịka Onyeisiala

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Disemba 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Jessica Nwankwo, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Ọtụtụ mmadụ anwụọla n’ọdachị ụgbọelu kụkpọrọ na Kazakhtan

    Akụkọ kwuru na ọtụtụ mmadụ anwụọla n’ọdachị ụgbọelu kụkpọrọ na mba Kazakhtan ụbọchị Wenezde, 25 Disemba, 2024.

    Ozi si n’ụlọọrụ gbatagbata mba ahụ kwuru na mmadụ iri isii na asaa n’ọ n’ụgbọelu ahụ nwuru ọkụ ma kụkpọọ oge ọ na-achọ ịda n’ọdọụgbọelu dị na mpaghara Aktau.

    Ozi ahụ kwuru na mmadụ iri abụọ na ise ji ndụ ha pụta n’ọdachị ahụ.

    Ụgbọelu Azerbaijan Airlines flight J2-8243 si isi obodo Azerbaijan bụ Baku eme njem aga Grozny dị na mba Rọshịa oge ndị ọrụ hazigharịrị usoro maka ajọ ihu igwe.

    Ihe onyonyo pụtara ihe gosịrị oge ụgbọelu nwuru ọkụ dịka ọ na-achọ ịda n’ọdọụgbọelu dị n’Aktau.

    Akụkọ kwuru na n’ime mmadụ iri issi na abụọ nọ n’ụgbọelu ahụ kụkpọrọ, ọtụtụ n’ime ha bụ ndị mba Azerbaijan nakwa ndị mba Rọshịa, Kazakhstan na Kyrgyzstan.

    N’ime mmadụ iri abụọ n’ise ahụ ji ndụ ha pụta, e bugara mmadụ iri abụọ na abụọ ụlọgwụ.

    Gọọmenti Kazakhtan kwuru na ha amalitela ime nnyocha iji chọpụta ihe butere ajọ ọdachi a. Ụlọọrụ na-arụpụta ụgbọelu ma bụrụkwa ndị rụrụ ụgbọelu ahụ bụ Embraer, gwara BBC na ha dị njikere inyere aka na nnyocha ahụ.

  2. Oku Gọvanọ steeti ụfọdụ kpọrọ n'emume Ekeresimesi

    Dịka ndị ụka Kraịst na Naịjirịa na-esonyere ndị otu ha n’ụwa niile gbaa gburugbruru n’emume Ekeresimesi afọ 2024, Gọvanọ steeti dị iche iche na-akpọ ka e jiri ohere emume a mwulite udo, ịdịnotu na ihụnanya na Naịjirịa.

    N’ozi o wepụtara taa, Gọvanọ Chukwuma Soludo na-achị Anambra steeti kwuru na mmemme Ekeresimesi bụ nke na-achetara anyị bụ mmadụ maka ịhụnanya chukwu nwere ebe anyị bụ mmadụ nọ.

    Ọ kpọrọ ka ndị Anambra niile mwulite udo na ịhụnanya ma nwee olileanya na ihe niile ga-adịmma. O ji ohere ahụ ziga ozi itiaka n’obi nye ezinaụlọ ndị ahụ a zọgburu ebe a na-ekesa osikapa n’Okija.

    Gọvanọ Duoye Diri na-achị Bayelsa steeti gwara ndị ụka Kraịst ka ha hụ mmadụ ibe ha n’anya ma nyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka.

    Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu na-achị Legọs kpọrọ oku ka onye ọbụla nagide mmadụ ibe ya n’agbanyeghị nkwenye onye ahụ.

    Gọvanọ Oyo steeti bụ Seyi Makinde kpọrọ uko ka e nwere ohere emume ekeresimesi a kpeere Naịjirịa ekpere iji hụ maka ọganihu obodo.

    N’aka nke ọzọ, Gọvanọ Usman Ododo na-achị Kogi steeti kwuru na emume Ekeresimesi bụ ihere e ji echeta ịhụnanya chineke ebe mmadụ nọ. O kpọrọ oku ka e ji ohere a mwulite ezị ihunanya.

    Gọvanọ Enugwu steeti bụ Peter Mbah kpere ekpere ka e nwee ezi udo na Naịjirịa site n'emume Ekeresimesi nke afọ a.

  3. Onyeisiala Ukraine akatọọla ogbunigwe Russia tụrụ n’Ukraine ụbọchị ekeresimesi

    Dịka ndị ụka kraịst na-emerube emume ekeresimesi nke afọ 2024, mba Rọshịa tụrụ ogbunigwe na mba Yukren ọkachasị na mpaghara mba ahụ Yukren na-emepụta ọkụ.

    Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky kọwara mwakpo ahụ dị nke gosịrị ezi obi ịta mmiri n’ebe mba Rọshịa nọ. O kwuru na Rọshịa tụrụ ogbunigwe ruru iri asaa nakwa dronu ruru otu narị, mana Yukren gbaturu ogunigwe iri ise.

    Na Kyiv, ọtụtụ gbagara n’ọdọ ụgbọoloko dịka ha nwetara ozi maka mwakpo ahụ.

    Ka ọ dị ugbua, ewepụla ọkụ latrik n’ọtụtụ mba Yukren ọkachasị na Kyiv

  4. Ụtụtụ ọma ndị be anyị, Ekeresimesi ọma nụ ooo

    Daalụ maka isonyere BBC Igbo dịka anyị na-enwetara gị akụkọ si mbaụwa niile.

    Ka ihe ọma mere onye ọbụla taa.

  5. Gọvanọ Mbah ebinyela aka na 2025 bọjet Enugwu steeti bụ 971bn

    Gọvanọ na-achị Enugwu bụ Peter Ndubuisi Mbah ebinyela aka na bọjet afọ 2025 steeti ahụ ọnụego ya dị narị ijeri naịra itoli na iri asaa na otu (971bn).

    Gọvanọ Mbah binyere aka na bọjet ahụ nke mere ọ bụrụ iwu mmefu ego nke afọ 2025.

    E kere bọjeti ahụ ụzọ abụọ, nke e ji arụ ọrụ mmepe obodo bụ nke a kpọrọ “Capital Expenditure” na nke e ji akwụ ụgwọ a kpọrọ “recurrent expenditure”.

    Ego a manyere maka mmepe obodo bụ narị ijeri naịra asatọ na iri atọ na asaa na ụma itolu (837.9bn) ya bụ pasenti iri asatọ na isii (86%) ebe ego a manyere maka ịkwụ ụgwọ bụ otu narị ijeri naịra na iri atọ na atọ na ụma (133.1bn) bụ pasenti iri na anọ (14%).

    Gọvanọ Peter Mbah kọwara mmefu ego nke afọ 2025 dịka ihe ga-enye aka na mmepe Enugwu steeti.

    Ndị nọ mgbe Gọvanọ Mbah binyere aka n’akwụkwọ bọjet 2025 gụnyere Onyeisi ndị omeiwu na steeti ahụ bụ Uchenna Ugwu, osote ya bụ Ezenta Ezeani na ndị ọzọ.

    Mana mgbe onyeisi ndị omeiwu n’Enugwu steeti bụ Uchenna Ugwu na-agwa ndị ntaakụkọ ọkwu ka ọ sịrị na “enweghị ihe ha gbanwere na bọjet 2025”.

    Ọ kọwara na ndị omeiwu mere ya ọ bụrụ iwu na-enweghị mgbanwe n’ime ya maka na “mgbe Gọọmenti Enugwu na-ede bọjet 2025 ha mere ka ndị omeiwu sonyere ha”.

  6. Ndị uweojii egbuola ndị ntọrị atọ, nwụchie abụọ n’Imo steeti

    Ndị uweojii Imo steeti awakpoola ndị ntọrị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB).

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye kwuru nke a n’ozi o wepụtara n’ụbọchị Tuzde 24 Disemba 2024.

    Ya bụ ozi kwuru na ndị uweojii na ndị ntọrị ahụ kwakọrịtara onwe ha mgbọ n’Orogwe dị n’Okpuru ọchịchị Owerri West, Imo steeti n’ụbọchị 19 Disemba 2024.

    Ọ sịrị na ndị uweojii gbagburu ndị ntọrị atọ ma nwụchie abụọ ndị nke ọzọ bụ David Ifeanyichukwu gbara afọ iri abụọ (20) na Abuchi Joseph gbara afọ iri abụọ na anọ (24).

    Ọ kọwara na ndị ojiegbe ahụ tọọrọ Osuji Caleb Chimereze na mmadụ atọ ndị ọzọ n’ụbọchị 12 Nọvemba 2024 ma zurukwa ụgbọala Mercedes Benz na ngwongwo ndị ọzọ bara uru.

    Ka osinadị, Okoye kwuru na ndị uweojii abụọ tụfuru ndụ ha oge ha na ndị ojiegbe ahụ na-akwakọrịta mgbọ.

    Ngwongwo ndị uweojii napụtara ndị omekome ahụ gụnyere egbe AK-47 isii, mgbọ egbe otu narị na iri na atọ (113), egbe ntụ na ụgbọala abụọ ha zuru n’ohi.

  7. Ụlọikpe enyela iwu ka e jichie Naomi Silekunola na Onyeisi ụlọakwụkwọ maka nzọgbu ụmụaka n’Ibadan

    Ụlọikpe Majie dị n’Iyaganku Ibadan enyela iwu ka e jichie mmadụ atọ a kpọrọ aha banyere nzọgbu ụmụaka n’ụlọakwụkwọ Bashorun Islamic High School.

    Ha bụ mmadụ atọ gụnyere Onyeisi ụlọakwụkwọ Bashorun Islamic High School bụ Abdullahi Fasasi, onye hibere ụlọmgbasaozi Agidigbo FM bụ Alhaji Oriyomi Hamzat na onye bụbu nwunye Ooni ndị Ife bụ Naomi Silekunola.

    Ụlọikpe ahụ Ọkaikpe Olabisi Ogunkanmi nọ n’isi ya nyere ya bụ nchabi ikpe n’ụbọchị Tuzde 24 Disemba 2024.

    Oge ọ nụchara ikpe ahụ, Ọkaikpe Olabisi Ogunkanmi nyere iwu ka e jichie ha bụ mmadụ atọ n’ụlọmkpọrọ Agodi dịka a na-eche maka ntụziaka onye na-ahụ maka ikpe ọhanaeze n’Oyo steeti.

  8. A malitela ngagharịiwe na Syria maka osisi Ekeresimesi a kpọrọ ọkụ

    Ngagharịiwe amalitela na mba Sirịa maka osisi Ekeresimesi a kpọrọ ọkụ n’akụkụ obodo Hama.

    Ihe onyonyoo n’efegharị na sohal midia gosịrị ụmụnwoke kpuchiri ihu ma mụnye osisi ahụ dị n’ogige Suqaylabiyah ọkụ.

    Otu nnupuisi alakụba wepụrụ Onyeisiala Bashar-al-Assad n’ọchịchị, kwuru na ha anwụchiela ụmụnwoke ahụ kpọrọ osisi ahụ ọkụ ma kwuo na ha bụ ndịagha mba ofesi.

    Ọtụtụ puku ndịngaharịiwe juputara n’okporoụzọ mba ahụ ma na-ekwu ka ndị iis mba ahụ nweta nchekwa nye ndị okpukperechi nta mba ahụ.

  9. Igbo ndị ọma, unu abọọla chi?

    Anyị awụchiela ọzo n'ọgbakọ BBC Igbo.

    Gaa n'ihu sonyere anyị dịka anyị na-enwetara gị akụkọ si mbaụwa.

  10. A malitela ngagharịiwe na Mozambique dịka ụlọikpe nabatara mmeri Daniel Chapo

    Ọtụtụ mmadụ a malitela ngagharịiwe na Mozambique dịka Ụlọikpe kachasị elu nabatara mmeri Daniel Chapo, bụ onye na-anọchite anya otu ndọrọndọrọ ọchịchị nọ n'ọchịchị, bụkwa onye meriri ntụliaka e mere n’ọnwa Ọktoba, 2024.

    Ngagharịiwe tara akpụ malitere na mba ahụ mgbe mbụ enwpụtara aha ndị meriri na ntụliaka ahụ.

    Otu onye e meriri na ntụliaka ahụ bụ Venâncio Mondlane, gwara ndị na-eso ya ka ha malite ngagharịiwe megide ntuliaka ahụ nke ọ sị na nrụrụaka dị na ya.

    Ndị na-eme ngagharịiwe bidoro n’ubọchị Mọnde 23 Disemba 2024, na-agagharị ma na-akpọ aha Venâncio Mondlane, na-agbakwa afọ ụgbọala ọkụ, nọchie ụzọ ma na-atụ ndị uweojii okwute nke mere ka ndị ọrụ nchekwa malite ịgba ndị mmadụ anwụru anya mmiri.

  11. IGP agwaghị ụmụ Naịjirịa tie ndị uweojii ihe n’okporoụzọ

    Ndị uweojii akatọọla akụkọ ahụ kwuru na onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Kayode Adeolu Egbetokun nyere iwu ka ndị mmadụ tie ndị uweojii ihe maka ịkwụsị ha n’okporoụzọ.

    Akụkọ ahụ kwuru na “onyeisi ndị uweojii nyere iwu ka ndị mmadụ nuso onye uweojii ọbụla chọrọ ime nyocha n’ekwentị ha ọgụ ma tie ha ihe”.

    Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Olumuyiwa Adejobi kọwara akụkọ ahụ dịka “okwu ụgha, na ihe na-ekwesighi ime na mbụ”.

    Adejobi ji akara X soshal midia were katọọ okwu ahụ na-efehari n'akara soshal midi ma si na “IGP enweghị mgbe ọ nyere udiri iwu ahụ kwadoro ịnuso ndị uweojii ọgụ maọbụ iti ha ihe”.

    “E ji m ohere a nwere na-agwa ndị mmadụ ka ha hara ịdaba n’aka ndị na-ekesa akụkọ ụgha”.

    Ọ kwuru na ndị uweojii na-agba mbọ ime ka ndị uweojii na ndị obodo ebe ha na-echekwa nọrọ n’udo ma na-arụ ọrụ nke ọma.

  12. Mmadụ itoolu anwụọla n’ihe mberede okporoụzọ n’Abia Steeti

    Akụkọ anyị nwetara kwuru na mmadụ itoolu anwụọla n’ihe mberede okporoụzọ mere oge ha si Umuahia aga Ohafia dị n’Abia steeti ụbọchị Sọnde 22 Disemba, 2024.

    Ndị hụrụ oge ihe ahụ mere kwuru na mmadụ itoolu ahụ ji ụgbọala Toyota Siena eme njem oge nnukwu ụgbọala bu aja kopuru kurie ụgbọala ha.

    Mbọ niile a gbara ịnụ ọnụ okwu ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia steeti amịtaghị mkpụrụ.

    Ka ọ dị ugbua, gọọmenti Abia steeti na ụlọorụ Federal Road Safety Corps ewepụtabeghị ozi ọbụla banyere ihe mberede ahụ.

  13. Osote Onyeisiala Kashim Shettima ezigala ozi iti aka n’obi nye ezinaụlọ ndị a zọgburu

    Osote Onyeisiala Kashim Shettima eziagala ozi iti aka n’obi nye ezinaụlọ ndị a zọgburu ma meruo ndị nke ha n’Oyo, Abuja nakwa Anambra steeti.

    N’ozi ahụ nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Stanley Nkwocha binyere aka, Osote Onyeisiala Shettima gosiputara enweghị obiụtọ ya n’ihe ọdachi ndị ahụ. Ọ katọrọ nzọgbu ndị ahụ ma kwuo na ọ bụ ihe a kara igbochi ma ọ bụrụ na enwere ezi nhazi.

    O kwuru na na gọọmenti etiti kwụrụ chịm inye ezinaụlọ ọdachi a metụtara nkwado

    Cheta na a zọgburu ụmụaka iri atọ na ise (35) na Islamic High School dị n'Ibadan bụ ebe Wings Foundation na ụlọ ntaakụkọ Agidigbo Fm jikọrọ aka hibe mmemme enyemaka maka ụmụaka.

    Ebe a zọgburu opekatampe mmadụ iri (10) oge a na-ekesara ndị ụwa na-atụ n’ọnụ na ndị okenye ihe oriri n’ụlọụka Holy Trinity Catholic Church dị na Maitama Abụja.

    Ndị uweojii Anambra steeti kwuru na mmadụ iri abụọ na abụọ nwụrụ na nzogbu nzọgbu mere ebe a na-eke osikapa n'obodo Okija nke okpuruọchịchị Ihiala dị n'Anambra Steeti na Satọde 21 Disemba, 2024.

    Osote Onyeisiala Shettima kwere nkwa na gọọmenti ga-eme nnyocha iji chọpụta ihe kpatara ọdachi ndị ahụ.

  14. Aka akparala mmadụ karịrị 400 maka ịga agbamakwụkwọ ụmụaka n'India

    Ndị uweojii n’India ejidela mmadụ karịrị 400 dịka ha wakporo ogige ebe a na-eme agbamakwụkwọ ụmụaka nke iwu na-akwadoghi na steeti Assam.

    Mịnịsta nke steeti ahụ bụ Himanta Biswa Sarma kwuru na a ga-akpụpụ ndị a n’ụlọikpe, ma kwuo na ndị ọrụ nchekwa ga-aga n’ihu na-ebuagha megide ihe ọ kpọrọ ‘mmetọ agụmaakụkwọ’.

    O mere achụmnta vootu n’elu nkwa ịkwụsị agbamaakwụkwọ ụmụaka na steeti Assam n’afọ 2026.

    Otu United Nations kwuru na mba India nwere ụmụaka karịrị nde 200 bụ ndị nọ na di na-agbanyeghi na ọnụọgụgụ ahụ na-agbatu n’afọ nso nso a.

  15. A nwụchiela nwafọ Saụdi Arabịa a na-enyo na mwakpo mere n’ahịa Ekeresimesi mba Jamini

    Otu ọkaikpe n’obodo Magdeburg mba Jamini enyela iwu ka a kpọchie otu nwafọ mba Saụdi Arabia bụ onye a nwụchiri n’ebubo na aka ya dị na mwakpo mere n’ahịa Ekeresimesi dị n’obodo ahụ.

    Nwamadị a gbara afọ iri ise ka a kpụpụrụ n’ụlọikpe n’ụbọchị Satọde n’ebubo na o bu ụgbọala gbaba n’etiti ebe igwe mmadụ juru n’ahịa ahụ.

    Na mgbasaozi ọkaiwu ukwu nke obodo Magdeburg bụ Horst Walter mere, o kwuru na nwoke ahụ kpara nkata tupu o mee nwakpo ahụ naanị ya.

    O kwuru na akụkọ ndị nọ na-efegharị na soshal midia unyaahụ na abụghị eziokwu, na ọ bụ naanị otu onye kpara arụ a naanị na enweghi onye enyemaka ọbụla.

    Opekatampe ihe ruru mmadụ ise nwụrụ, nke gụnyere ụmụnwaanyị atọ na otu nwata nwoke dị afọ itoolu ebe mmadụ karịrị 200 merụrụ ahụ na mwakpo ahụ mere na mgbede Fraịde.

  16. Igbo ndị ọma anyị ekelee ooo!

    Anyị ji obi aṅụrị anabata unu n'ọgbakọ anyị n'izuụka Ekeresimesi nke afọ 2024.

    Anyị na-asị ka ụbọchị niile nke oge emume maara gị na mma.

    Jisiekwa ike na-anọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo.

    Daalụ!

  17. A zọgbuola mmadụ 10 n’Abuja

    A zọgbuola opekatampe mmadụ iri (10) oge a na-ekesara ndị ụwa na-atụ n’ọnụ na ndị okenye ihe oriri n’ụlọụka Holy Trinity Catholic Church dị na Maitama Abụja.

    Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun sịrị na ọ bụ nleghara anya nke ndị haziri ya butere ọnwụ mmadụ ndị ahụ.

    Oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’ụbọchị Satọde 21 Disemba 2024, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Naịjirịa bụ Olumuyiwa Adejobi sịrị na Egbetokun agwala kọmịshọna ndị uweojii na steeti dị iche iche a hụtara ọnọdụ ahụ ka ha mee ezigbo nnyocha.

    Ọ gwakwara ndị ọrụ gọọmenti, otu dị che iche, mmadụ nkịtị , ndị ndu obodo na ụlọorụ ndị abụghị nke gọọmenti ka ha jikọta aka chọpụta usoro dabara adaba ha ga-eji na-ekesara ndị mmadụ ngwa enyemaka.

    Egbetokun dọrọ ndị na-akwado ịhazi ụdị emume dị etu ahụ aka na ntị ka ha gbaa mbọ hụ na ha kpọbatara ndị ọrụ nchekwa iji gbochie ihe ọdachi ọbụla ịdapụta.

    Cheta na a zọgburu ụmụaka iri atọ na ise n'Ibadan dị n'Oyo steeti n'ụbọchị Wenezde 18 Disemba 2024, zọgbuo mmadụ atọ n'Okija dị n'Anambra steeti nakwa mmadụ iri (10) n'isi obodo Naịjirịa bụ Abụja n'ụbọchị Satọde 21 Disemba 2024 oge a na-ekesara ndị mmadụ ihe oriri.

  18. E gbuola mmadụ 5 n’ahịa Ekeresimesi dị na Germany

    N’abalị Fraịde 20 Disemba 2024, otu nwoke buuru ụgbọala kpọkaa ndị na-azụ ahịa n’ahịa Ekeresimesi dị na Magdeburg mba Jamini.

    Mwakpo ahụ egbuola mmadụ ise dịka ihe karịrị mmadụ narị abụọ (200) merụrụ ahụ nke ọtụtụ n’ime ha nọ n’ezigbo ọnọdụ ọjọọ.

    A nwụchiela otu nwoke maka mwakpo ahụ dịka ndị uweojii kwenyere na ọ bụ naanị ya kpara nkata mee ya bụ mwakpo.

    Ka o siladị, amatabeghị ndị ahụ ya bụ ọdachi dakwasara mana onye Chancellor mba Jamini bụ Olaf Scholz depụtara n’akara ọbaozi X ya kwuo na “ozi e nwetara na Magdeburg akpalitela nnukwu ụjọ”.

  19. Yahaya Bello enwerela onwe ya ka o mezuru ihe dị n’iwu ntọghapụ beelu ụlọikpe nyere ya

    Aka chịburu Kogi Steeti bụ Yahaya Bello enwerela onwe ya dịka o mezuru ihe dị n’iwu ntọghapụ belụ nke ụlọikpe ukwu nọ n’isi obodo Naịjịrịa enyere ya n’ụbọchị Fraịde 20 Disemba, 2024.

    Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Nigerian Correctional Service nke dị n’Abuja bụ Adamu Duza rute ndị ntaakụkọ aka kwuru na Bello alaghachila ụlọ ya n’abalị ụbọchị Fraịde.

    Onye Ọkaikpe bụ MaryAnne Anenih nyere iwu ka Bello kwụọ ugwọ ọnụego ya pụtara narị nde naịra ise (500m), nwete mmadụ atọ ndị akaebe nwere ihe onwunwe na mpaghara ahọpụtara ọnụahịa dị elu n´Abuja ma nyefee ụlọikpe akwụkwọ ikike ime njem ya ka ọ ghara inwe ike hapụ obodo Naịjịrịa.

  20. Ndi uweojii anwụchiela ndị a na-enyo enyo maka ịtọ mmadụ na izu ohi

    Ndị uweojii Enugwu Steeti ekwuola na ọrụ nchekwa ha na arụ ị ji hụ na emume ekeresimesi nke afo a ebidola ịmịta ezigbo mkpụrụ dịka ha wakporo ụlọ nzuzu ndị ntọ dị na otu ime obodo dị n'okpuru ọchịchị Nsukka.

    Ndị uweojii ahụ nwụchiri mmadụ ise a na-enyo enyo n’aka aha dị na-ụdị ohi dị ichie ichie nke gụnyere izu ohi n’ụlọ ndị mmadụ na izu ohi ụgbọala.

    Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe, kọwara na ha wakporo ụlọ nzuzu ndị ntọ ahụ ma nweta ọtụtụ ngwa agha dị iche iche, uwe ndịagha, ụgbọala e zuru ezu, igwe Moniepoint POS na kaadị eji adọrọ ego n’igwe ATM

    Ndukwe kwuru na mwakpo ahu mere n´ụbọchị Satọde Disemba 15, 2024 mgbe ndị uweojii na-arụ oru n’ime obodo Nru nke dị n'okpuruọchịchị Nsukka.

    Ndị ahụ a na-enyo enyo na ndị uweojii bidoro ịgba egbe, mana ha gbapụrụ ọsọ mgbe ọtụtụ n’ime ndị ohi ahụ mmerụrụ ahụ.

    Nnyocha mbụ gosiri na ndị otu ahụ na-etinye aka n’ihe ọjọọ dị iche iche gụnyere ịtorọ mmadụ na mpụ ndị ọzọ jọgburu onwe ya.