You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ụbọchị ncheta Biafra: Ka o si gaa

Ka o si aga n'ihe gbasara ncheta Biafra na Naijiria na ụwa gburugburu taa bụ Mee 30, nke afọ 2019.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chiagozie Nwonwu

  1. Aba gbara chako ka ha mere 'sit-at-home' nke ha, Sọ ndị ọkwọ ụgbọala ka a hụrụ n'ụzọ. Ka ahịa niile, ụfọdụ ụlọakwụkwọ na ụlọakụ mechiri emechi.

  2. Onicha, Nnewi na Aba nụtara oku Ipob maka Mee 30

    Ka chi foro taata, ọtụtu ndị bi na Onicha, Nnewi nakwa Aba kwenyere ịnọdụ na be ha dịka otu Indigenous People of Biafra siri rịọ ha.

    Ahịa gbachichara n'obodo ndị a, dịka ụlọ akụkwọ nakwa ụlọ akụ siri gbachie.

    Mana, na obodo ndị ọzọ dịka Enugwu, Abakaliki, Owere na Umuahia ahịa na-azụ, umụ akwụkwọ gakwa akwụkwọ.

    Ụfọdụ ndị BBC gbara ajụjụ ọnụ na steeti ndị a kwuru na ha kwadoro icheta ndị nwụrụ n'agha Biafra mana ha pụtara ịchọ ihe ha na ezinaụlọ ha ga-eri.

    Ndị kwadokwere ihe a na-eme gwara BBC Igbo na atụmatụ 'sit-at-home' a ga-enyere ha nwete Biafra ọsịsọ.

  3. 'Head Bridge' Onicha

  4. Ndị agha majuru Afara-Ukwu taa bụ ụbọchị 30 nke Mee, afọ 2019

  5. Ahịa mechisiri n'Ogbunike, n'Onicha nakwa Nnewi n'ụbọchị Mee 30

    Onye ntaakụkọ BBC si gara Onicha ịhụ etu esi eme emume ụbọchị Mee 30.

    Ọ kwuru na ọtụtụ ahịa ọ gara gbachiri agbachi ka ndị mmadụ na-eme "sit at home" ndị Ipob.

    Ahịa Ogbunike, ahịa "Building Material" n'Onicha nakwa ahịa nile dị n'ụzọ Awka ruo "Head Bridge" gbachiri agbachi ka ndị mmadụ nọ n'ụlọ maka oku ndị Ipob kpọrọ.

  6. Ka o si aga n'Owere n'ụbọchị Mee 30

  7. Ka o si aga n'Ahịa 'New Parts' n'Onicha

  8. Ihe onye ntaakukọ BBC hụrụ n'Ogbunike n'ụbọchị Mee 30

  9. Lee ka o si aga n'Abakaliki n'ụbọchị Mee 30

  10. Ihe ndị Imo na-ekwu maka ´Ụbọchị Ncheta Biafra'

  11. N'Enugwu, ndi mmadụ pụtara ka ụbọchị ọ bụ Mọnde

    Lee etu taa si aga n'Enugwu.

  12. Ihe ndị Ebonyi na-ekwu maka 'Ubochi Ncheta Biafra' nke 2019

  13. Ndị Naịjirịa ejibeghi ihe mere n'agha Biafra mụta ihe - Okey Ndibe

    Okey Ndibe sị na, "Agha abụghị ihe onye ọbụla hụrụ ihe mere n'afọ 1967 ruo 1970 ga-asị ka o mee ọzọ." O kwukwara ihe mere ogbaghara jiri ka dị n'ala Naịjirịa ruo taa.

    O nyere ndị ntorobịa ọdụmọdụ gbasara otu ha siri chọọ ka ha nwe nwereonwe nke ha - nsogbu ga-adị na ya na ihe ha kwesiri ime.

  14. Ihe Nnamdi Kanu kwuru maka Biafra

    BBC Igbo na onyeisi otu na-achọ Biafra bụ Nnamdị Kanu nwere mkparịtaụka na mbido afọ a.

    Lee ụfọdụ ihe okwuru maka Biafra

  15. Etu ọ dị n'Abia Tower, Umuahia n'ụtụtụ a

  16. Onicha so na-eme 'Sit at Home'!

    Onicha sonyere atumatụ ịnọdụ n'ụlọ nke ọfụma.

    Site "Head Bridge" ruo Mkpọ ahịa mgbachisiri agbachi, dịka ndị BBC gbara ajujụ ọnụ siri kwuo.

  17. Onye ntaakuko BBC n'Owere na-akọwa na obodo na-ekwo ka ọnweghị ihe na-eme.

  18. Enugwu anaghị eme ndọdụ n'ụlọ maka Biafra

  19. Ka a na-ekwu maka Biafra, lee ihe ịmaghị maka Ojukwu

    Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu bụ otu onye Ndigbo agaghị echefu aha ya echefu, mana gịnị ka ịmaghị maka ya?

    N'ịcheta ndụ o biri n'ụwa, Elliot Uko, onye buru Ojukwu akpa ọtụtụ afọ tupu ọ nwụọ, kwuru na Ojukwu ejighị ịhụnanya Ndigbo nwere ebe ọ nọ kpaa ego dịka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ugbua na-eme.

    Lee ihe Maazị Uko gwara BBC Igbo:

  20. Ọ dịka Onicha kwenyere n'atụmatụ 'Sit At Home' Ipob kpọrọ

    N'ihe dabara n'akukọ BBC Igbo dere ụnyaahụ, foto na ozi soshal midi si Onicha na-egosi na ndị mmadụ kwenyere mee ịnọdụ n'ụlọ maka ncheta Biafra.

    Ndị BBC kpọrọ n'Onicha sị na ụzọ dị chakoo.

    Lee akuko anyị maka Onicha na Nnewi.