You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Otito na ndị nwunye na-alụ ọgụ

Mmemme akwamozu onye ndorondoro ọchịchị ama ama na ọsote onyeisi ala oge gara aga bụ Alex Ekwueme.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Eliela Ekwueme ka nnukwu mmadụ ọbụ

    Ndị biara akwa n'akwamozu Ekwueme alawala.

    Lotanụ na Yemi Osinbajo bụ osote onye isi ala kọwara Ekwueme dika okosisi Naijirịa ekwesiri ikwanyere nnukwu ugwu.

    O jikwa ohere ahụ kwupute na gọomentị etiti abaala Mahadum akpọrọ Ndufu-Alike Ikwo n'Ebonyi steeti n'aha Alex Ekwueme.

    Nonyere BBCIgbo.com maka akụkọ ndị ọzọ na bịa.

  2. Ọgụ ndị nwunye Ekwueme

    Dịka ichie ọ bụ, ọ fọrọ ntakịrị ka ndị nwunye Ekwueme kụọ ọkpọ ebe ha na-azọ oche. Nwunye nke mbụ ekweghi anọkete nwunye ya abụọ ndị ọzọ,sị n'aha bụ ụmụnwaanyị ndị ikom Ekwueme.

  3. Ihe ndị mmadụ n'ekwu n'ịgwe okwu

    Ka a na-akwa Ekwueme, ma ndị ukwu ma ndị nta na-esi igwe okwu na-egosipụta nkwado ha kwadoro ezi na ụlọ Ekwueme na akwamozu ya:

  4. Ọkpara Ekwụeme n'ekele oha na eze

    Ihe onyonyo a n'egosi dị ọkpara Ekwueme ebe ọnọ n'ekele igwe mmadụ pụtara ikwado akwamozu nna ya:

  5. Ugwu ka ugwu - okpu mmemme n'elu akpatị ozu ya

    Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe mmemme a na-aga eziterela anyị foto.

    Foto nke a gosiri okpu mmemme edowere n'elụ akpatị ozu Ekwụeme, nke a gosiri naọbụ onye amama:

    Ndị nnukwu mmadụ pụtara n'ime ụlọụka i so kwanyere ya ugwu. Nwunye onye bụ onyeisiala mbụ bụ Patience Jonathan na ndị ụkochukwu ukwu sonyere na mmemme a:

  6. A donyela Ekwueme n'ala

    Ndị mmadu kariri puku iri zukọtara n' Oko dị na steeti Anambara iji gba aka ebe ka a donyela ozu Alex Ekwueme n'ili.

    Ha gụnyere onye isi ala chịburu mbụ bụ Goodluck Jonathan na oriakụ ya, Gọvanọ Sokoto steeti, Aminu Tambuwal,nke Abia steeti Gọvanọ Okezie Ikpeazu, nke Delta Steeti, Gọvanọ Ifeanyi Okowa.

    Ndị ọzọ bụ Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige na odeakwụkwọ nke gọọmentị etiti bụ Boss Mustafa.

  7. Agụgharịala mahadum Ebonyi aha Ekwueme

    Dika Ebere Ekeopara,ọnye ntaakụkọ BBC siri kwuo,osote onyeisi ala bụ Prof Yemi Osinbajo nọrọ na akwamozụ ahụ ma ọkwa na onyeisi ala bụ Muhammadu Buhari emeghariala aha Federal University Ndufu-Alike, Ikwo (FUNAI) dị n' Ebonyi steeti ka ọ bụrụ 'Ekwueme University'.

  8. Ọtụ e si eli nnụkwụ mmadụ n'ala Igbo

    Ọ bụrụ na-akachara ya ụka n'ụlọụka, a ga-ebụ ọzu ya gawa n'ụlọ ya ebe ndị ikwu na ibe, ndị enyi na ndị ọgo ga-abiara ya ụlọ akwa.

    Ha ga-eji akwa, ego, mmanya na ihe onyinye dị icheiche. Ụfọdụ ga-akpọrọ ndị egwu bịa.

    Ọtutụ ndị otu na nzụkọ ga-abiakwa mgbaru iji kwanyere ya ugwu.

    Ana agbakwara onye dị otu a egbe mkpọna ala iji dulaa mụọ ya.

  9. Ebubatala ọzu Ekwueme n'ụlọụka

    Ebere Ekeọpara, onye ntaakụkọ BBC kwuru na ebubatala ozu ọke osisi Igbo ji eje mba bụ Dr Alex Ekwueme n'ime ụlọụka St John Divine Anglican Church, Oko, Anambra steeti ka akara ya uka ikpeazụ.

  10. Ndị eze na ndị ọdịnala so kwanyere ya ugwu

    Ụnyaahụ, ndị eze na ndị ọdịnaala sọ na ọtụ ndị gbakọrọ n'Ọka (Awka) , isiobodo, Anambara steeti maka nkwanye ugwu ikpeazụ:

  11. Ofufe nro ili ozu Ekwueme

    Onye ntaakụkọ BBC bụ Ebere Ekeopara nọ na St. John the Divine Anglican Church, Oko, Anambra Steeti maka ofufe nro ili ozu Ekwueme taata.

  12. 'Ekwueme enweghị ebubo mpụ ọbụla'

    Otu onye na ndị na-ekwu okwu ọma banyere Ekwueme bụ onyeisi Ohanaeze Ndigbo, Nnia Nwodo onyeisi Sineti n'ala Naijiria bụ Chief Ken Nnamani kwuru na ọ bụ onye eziokwu, na ọ nweghị ebubo mpụ ọbụla.

  13. 'Ṅomie nụ Ekwueme'

    Ụbọchị Wenezde, Bishop Emmanuel Chukwuma gwara ndị gbakọrọ n'emume ikwanyere Ekwueme ugwu ikpeazụ nke e mere n' Enugwu ka ha ṅyomie ezigbo ndụ Ekwueme biri mgbe ọ nọ ndụ:

  14. Ndị bịara akwa juputara n'Oko

    BBC ga-ewetara ụnụ ka o sị eme n' akwamozu Alex Ekwueme.

    Onye ndọrọndọrọ ọchịchị a amara amara nwụrụ na ọnwa Nọvemba afọ gara aga ka ọgbara afọ iri asatọ na ise. Ọtụtụ mmadụ bịara mmemme akwamozu ya na-etọ ya na-ekwupụta na o nweghị ebubo mpụ ọbụla.