Esoghị m na mmadụ 100 kacha nwee ego n'obodo m - Francis Nwaogwugwu 'Vintage'

Aha onyonyo, Abụghị m onye ndọrọndọrọ ọchịchị, abụ m o ji ego achụ ego - Vintage
Esoghị m na mmadụ 100 kacha nwee ego n'obodo m - Francis Nwaogwugwu 'Vintage'
Nkọwa foto, Francis Nwaogwugwu 'Vintage', bụ onyeisi ụlọọrụ Vintage Deluxe Interiors
    • Onye dere ya, Michael Ngene na Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist
    • Ebeg o si, Legọs

Na mkparịtaụka Francis Nwaogwugwu onye a maara dịka 'Vintage', na BBC News Igbo nwere, ọ kọwaara anyị etu njem azụmahịa ya si malite nakwa ịhụnanya o nwere n'ebe nwunye ya na ụmụaka ya nọ nakwa ihe mere o ji enyere ndị obodo ya Mbaise aka kwa afọ ọbụla.

Vintage gwara anyị na njem ya dịka onye na-achọ ụlọ mma 'interior designer' malitere oge ọ nọ na mahadum Anambra State University nke a maara dịka mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University ugbua.

Ọ gakwara n'ihu kwuo ọtụtụ ihe ndị ọzọ banyere etu ya na Obi Cubana, Zenco nakwa Cubana Chiefpriest si zute onwe na mahadum.

Otu ihe Vintage kwuru na mkparịtaụka a ọtụtụ na-amaghị bụ na ọ bụ ọgbaa bọọlụ ka ọ chọrọ ịbụ dịka nwatakịrị mana nne na nna ya ekweghị ya.