Ihe m jiri hiwe ebe a na-echekwa mmiri ara ụmụnwaanyị - Dkt Chinny Obinwanne

Aha onyonyo, Breastfeeding: Ihe m jiri hiwe ebe a na-echekwa mmiri ara ụmụnwaanyị - Dkt Chinny Obinwann
Ihe m jiri hiwe ebe a na-echekwa mmiri ara ụmụnwaanyị - Dkt Chinny Obinwanne

Dọkịta Chinny Obinwanne bụ onye nwe ụlọọrụ ebe a na-echekwa mmiri ara ụmụnwaanyị na Naịjirịa kwuru ihe o jiri hiwe ya.

Ụlọọrụ a a kpọrọ “MilkBankNG” bụ nke mbụ na Naịjirịa.

O kwuru na ọ bụ maka nsogbu o nwere iche nwa ya ara mgbe ọ mụrụ nwa ọhụrụ, na mmiri ara ya jụrụ ịgbapụta.

N’okwu ya “Dịka nne mụrụ nwa ọhụrụ, a dị m ka onye dara ada, mgbe ara m anaghị agbapụta mmiri ara ọfụma maka iche nwa m.

“Ọ dị m ka m dara ada n'ọrụ mbụ m dịka nne nwa.”

Ebe foto si, Getty Images

Dọkịta Obinwanne sị na ohiwere ụlọọrụ a n’ọnwa Ọgọstụ afọ 2022 maka ụmụ na-akaghị aka nakwa ndị nne mụrụ nwa ọhụrụ.

O kwuru ụmụnwaanyị ndị mmiri ara ha na-agba ọfụma na-abịa enye mmiri ara ha dịka ihe onyinye.

Ha na-echekwa mmiri ara ndị site n’ikike ọkụ latrik ruo mgbe a ga-enye ya ụmụaka ndị a na-akaghị aka bụ ndị nne ha na-enweghi ike ịgba mmiri ara ọfụma.

Kirie ihe o kwuru n’uju