Unlawful assembly bill: 'Onweghị mgbe iwu m na-ekwu maka ịtụ ndị ngagharịiwe nga'

Onye omeiwu na-anọchite anya Ahiazu/Ezinitte Federal Constituency n'Imo steeti bụ Emeka Martins Chinedu agọọla ụkwụ na aka na iwu ọ kwadoro akpọrọ "unlawful assembly bill" ekwughị na ndị na-eme ngagharị iwe ga-aga nga afọ ise.

O kwuru na iwu ahụ na-efegharị na soshal midia bụ nke ndị mmadụ ghọtahiere.

Chinedu sị na ya bụ nnghọtahie malitere n'aka akwụkwọ mgbasaozi biputara akụkọ maka ya bụ akwụkwọ iwu.

Ọ sị na ihe iwu ya na-ekwu bụ maka ibelata oke ogbugbu mmadụ ụfọdụ na-eme na-esoghị ụzọ iwu wepụtara.

Ihe Goddy Uwazuruike sara ya

Mana ọkaiwu kajara akaja bụ Goddy Uwazuruike sị na ihe ahụ Chinedu kwuru bụ okpotokpo asị gbara abụba.

Uwazuruike si, "ihe ọ na-ekwu bụ ihe m ga-akpọ arụ. Ihe ọ na-ekwu bụ maka ilee ndị mmadụ kechie ha ka mmadu ghara ikwu okwu".

Ọ sị na akwụkwọ iwu Naịjirịa nyere ndị mmadụ ikike ịme ọgbakọ nke udo nke Bekee kpọrọ "peaceful assembly".

O sị na nke Chinedu na-ekwu dị iche na ọ bụ ụdịri ihe na-eme na Hong Kong ugbua.

"Mmadụ abụọ nọrọ na-agba izu, ha ruo atọ, nsogbu apụtala".

Ọ sị na udi iwu a ga-eme ka ana-anwuchi ndị pụtara ngagharịiwe ngwangwa.

O sị na iwu Naịjirịa dị mma otu ọ dị ugbua.

Onye ebụla mehiere ebe ọ pụtara ngagharịiwe ga-ata ahụhụ dịịrị ya n'usoro iwu kwuru.

Na ya bụ akwụkwọ Chinedu dere ọ sị na "iwu kwesiri ijide onye ọbụla mebiri ihe agbanyeghị ma ihe o bu n'obi mewere ngagharịiwe akwụ ọtọ".

Uwazuruike kwuru na iwu Chinedu enweghị isi.

Ọ na-ekwusi ike na ihe Chinedu bu n'obi adịghị mkpa maka na ya bụ iwu ọchọrọ iwuputa chị eze.

Akakụ ga-amasị gị