You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu ogbugbu onye okada si bute ọgbaaghara n'Igboukwu, Ekwulobia, Oko
Obodo Igboukwu, Ekwulobia nakwa Oko nke dị n'Anambara steeti nọ n'ọgbaaghara n'ụbọchị Wenezde a n'ihi ebubo aka ike ndị uweojii.
Ndị ntorobịa e jirila iwe gbaa ụlọọrụ ndị uweojii atọ ọkụ n'obodo ndị a n'ihi ogbugbu otu onye ọkada.
Okafouzu Ugochukwu, onye Igboukwu hụrụ ihe niile merenụ kọọrọ BBC Igbo na ọ bụ ogbugbu ndị uweojii gburu otu onye okada kpatara ngagharịiwe ahụ.