Ọ bụghị eziokwu na anyị machiri inye ndị Ọwụwa Anyanwụ akwụkwọ njirimara

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Febụwarị 2026.

Nchịkọta

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Ndị uweojii UK amalitela inyocha Madelson maka ebubo na o zigaara Epstein ozi gọọemnti

    Peter Mandelson kwuru na ya ga-agba arụkwaghịm dịka onye omeiwu mba UK n'ụbọchị Wenezde 4 Febụwarị, 2026

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojii Metropolitan Police mba UK ekwuola na ha amalitela inyocha Peter Mandelson maka ebubo na ọ kpara ajọ agwa oge ọ nọ n’ọkwa.

    Nke a na-abịa dịka e boro Mandelson bụbu mịnịsta na-ahụ maka ọrụ ebubo na o zigaara Jeffery Epstein ozi gọọmenti dị oke mkpa.

    Ozi ụlọọrụ na-ahụ maka ikpe n’Amerịka bụ DoJ wepụtara gosiri na Mandeslon zigaara Epstein ozi gọọmenti mba UK oge ọ bụ odeakwụkwọ azụmahịa oge Gordon Brown bụ Praịm mịnịsta n’afọ 2009.

    Mandelson azaghị oku BBC kpọtụụrụ ya iji nụ ọnụ mmiri okwu ya bayere ebubo ahụ. mana BBC chọpụtara na Mandelson na-ekwu na aka ya dị ọcha ma kwuo na ya emeghị nrụrụaka ọbụla.

    Onye na-ekwuru gọọmenti UK kwuru na gọọmenti UK kwụrụ chịm inye ndị uweoji nkwado ọbụla ha chọrọ na nnyocha ha na-eme.

    Cheta na a chụrụ Mandelson dịka onye nnọchiteanya mba UK n’Amerịka na 2025 ma kwuo na ya ga-agba arụkwaghịm n’ụlọomeiwu n’ụbọchị Wenezde 4 Febụwarị, 2026.

    Gụọ akụkọ ndị ọzọ si UK:

  2. Gọvanọ Caleb Mutfwang na onye omeiwu mba Amerịka bụ Riley Moore enweela nzukọ

    Mgbe aka na-achị Plateau steeti Caleb Mutfwang na onye omeiwu mba Amerịka Riley Moore nwechara nzukọ

    Ebe foto si, Riley Moore/Facebook

    Nkọwa foto, Mgbe aka na-achị Plateau steeti Caleb Mutfwang na onye omeiwu mba Amerịka Riley Moore nwechara nzukọ

    Onye omeiwu mba Amerịka a ma ama bụ Riley Moore na aka na-achị Plateau steeti bụ Gọvanọ Caleb Mutfwang enweela nzukọ pụrụ iche.

    Moore kelere Gọvanọ Mutfwang maka nchekwa ọ na-echekwa ndị ụka Kraịst na ndị na-enweghị ike na mpaghara Middle Belt dị na Naịjirịa.

    Moore kọwara na ya na Gọvanọ Mutfwang nwere ezigbo mkparịtaụka gbasara ikwalite mmekọ n'etiti Naịjirịa na mba Amerịka.

    O kwuru na ya dị njikere ịhụ na mba Amerịka na gọọmenti Naịjirịa rụkọrọ ọrụ iji kwụsị nsogbu nchekwa na akụnụba karịsịa ogbugbu a na-egbu ndị ụka kraịst na Naịjirịa.

    Cheta na onye omeiwu Riley Moore bụ onye a ma ama na-akatọ ogbugbu ndị otu Karịst na Naịjirịa kemgbe Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump malitere ibu agha megide ogbugbu ndị otu Karịst na Naịjirịa.

    Gụọ akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a:

  3. Ụlọọrụ NECO ewepụtala mpụtara ule nke afọ 2025

    Ndị dere ule ahụ nwetara kredit ise ma karịa n’ihe ọmụmụ ha deere nke gunyere English na Mathematics

    Ebe foto si, PIUS UTOMI EKPEI/AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị dere ule ahụ nwetara kredit ise ma karịa n’ihe ọmụmụ ha deere nke gunyere English na Mathematics

    Ụlọọrụ na-ahụ maka nhazi ule ‘National Examinations Council (Neco) na Naịjirịa kwuru na ha ewepụtala mpụtara ule nke afọ 2025 maka ndị na-abụghị ụmụakwụkwọ si n'ụlọakwụkwọ ọbụla.

    Onyeisi ụlọọrụ NECO bụ Danlami Wushishi onye kpọpụtara mpụtara ule ahụ kọwara na mmadụ 96,979 binyere aka na mpụtara ụle ahụ nke gunyere ụmụnwoke 51,823 na ụmụnwannyi 45, 156.

    Dịka o si kwuo, n’ọnụọgụgụ mmadụ 96,979 tinyere aha ha n'ide ụle ahụ, ọ bụ mmadụ 95,160 bụ ndị mechara dee ule.

    Ọ gara n’ihu kwuo na pasenti 71.63 n’ime ndị mechara dee ule ahụ nwetara kredit ise ma karịa n’ihe ọmụmụ ha deere nke gunyere English na Mathematics.

    Wushishi sị na ndị mmejọrọ n'ule ahụ ruru mmadụ puku iri itoolu na iri na isii.

    Lee akụkọ ọzọ ga-amasị gị

  4. Ihe mere NLC, TUC ji kwụsị abụbọ ọrụ ha gbara maka ọdịmma ndị ọrụ n'Abuja

    Njirimara NLC na TUC

    Ebe foto si, NLC/Facbook

    Otu jịkọtara ndị ọrụ na nke ndị ahịa bụ Trade Union Congress of Nigeria (TUC) na Nigeria Labour Congress (NLC) akwụsịla abụbọ ọrụ ha gbara.

    Otu abụọ ndị ahụ mere ka a mata nke a n’akwụkwọ ozi edeakwụkwọ ha abụọ bụ NA Toro nke TUC na Benson Upah nke NLC binyere aka ma kesaa n’abalị atọ nke ọnwa Febụwarị, 2026.

    N’ozi ahụ ka ha kwuru na ha na mịnịsta na-ahụ maka Abuja bụ Nyesom Wike were mkparịtaụka nke Onyeisi kọmịtii Sinet na-ahụ maka Abuja bụ Sinetọ Mohammed Bomoi kwadoro.

    Ha kwuru na ha etinyela anya na mkpesa niile ndị JUAC nyere ma kpaa maka ya nke ọma.

    “Mịnịsta kwere ndị ọrụ nkwa na ha ga-akwanyere onye ọbụla ugwu dịrị ya ma na-enwe ezi mkparịtaụka n’ọdị n’ihu”.

    “Ha kwekọtara na enweghị onye ọrụ a ga-akpagbu maka ihe o mere mgbe ndị ọrụ na-agba abụbọ ọrụ”.

    “A ga-ewepụ ma kwụsị okwu niile dị n’ụlọikpe na-ahụ maka ọrụ”.

    Cheta na JUAC bụ mkpọbi okwun otu jịkọtara ndị ọrụ n’Abuja ana-akpọ Joint Union Action Committee bụ ndị mere ngagharịiwe ma gbaa abụbọ ọrụ maka ọnọdụ ha na etu gọọmenti enehara ọdịmma ha anya.

  5. E gwupụtara ogbunigwe yiri nke e ji lụọ agha Biafra n’Abia steeti

    Ihe dịka ogbunigwe a hụrụ n'Aba

    Ebe foto si, UEC

    Ndịagha Naịjirịa e werụla ihe yiri ogbunigwe e ji lụọ agha Biafra kamgbe 1967 nke ndị na-arụ ụlọ gwupụtere n'ime ala n’Aba bụ obodo e jiri azụmaahịa mara n’Abia steeti.

    Ọ bụ n’ụlọụka United Evangelical Church (UEC) dị n’ Ogbor Hill ka a hụrụ nke a mgbe ndị na-arụ ọrụ imezi ụlọ ụka ahụ na-egwu ala ka ha hụrụ ihe ahụ dịka ogbunigwe n’ime ala.

    Ndị na-egwu ala wepụtara ogbunigwe ahụ, gaa ebe ha ga-asa ya mmiri mana ụkọchukwu n’ụlọụka ahụ hụrụ ya ma gwa onye ọbụla ka ha hara imetu ya aka ọzọ.

    Onye hụrụ ihe mere gwara BBC na “ọ bụrụ na ogbunigwe ahụ gbara na mmadụ karịrị otu narị ga-anwụ n’ụlọụka ahụ nakwa gburugburu ya".

    Ndịagha Naịjirịa mechere gaa n’ebe ahụ, gwa ndị niile nọ nso ka ha pụọ tupe ha emee ka ọ hara inweike gba ọzọ ma buru ya pụọ.

    Onye agha na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC na ha “na-eme nnyocha maka ihe ha hụrụ” mana ndị hụrụ ya n’ebe e gwupụtara ya na-ekwu na ọ dịka ogbunigwe e tinyere n’ime ala n’oge agha Biafra.

    Ụkọchukwu ụlọụka ahụ bụ Thompson Ikpeoha kwuru na ọ bụ eziokwu na e gwupụtara ihe ahụ n’ụlọ ụka ha.

  6. Bill Clinton na Hillary Clinton ekwetala ịbịa zara ọnụ ha banyere ndekọ Epstein

    Onye bụbu Onyeisiala mba Amerịka na nwunye ya bụ Bill Clinton na Hillary Clinton

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Bill Clinton na Hillary Clinton

    Bill Clinton bụbu Onyeisiala mba Amerịka na nwunye ya bụ na Hillary Clinton ekwetela ịbịa kwuru ọnụ ha banyere ndekọ Epstein.

    Nke a na-eme n'ọnwa ole ma ole Clinton na nwunye ya jụrụ na ha agaghị aza oku ịzara ọnụ ha ndị omeiwu n’Amerịka kpọrọ ha banyere nnyocha a na-eme maka Jeffrey Epstein na ebubo etu Epstein si metọọ ọtụtụ ụmụnwaanyị.

    Bill Clintom maara Epstein nke ọma mana Clinton adịla na mbụ kwuo na ya amaghị ajọ agwa niile ọ na-akpa nke gunyere mmetọ ụmụnwaanyị ma kwuo na ha abụọ adịghịzị na mma ihe karịrị afọ iri abụọ tupu okwu ahụ adapụta.

    Esptein nwụrụ n’ụlọ nga n'afọ 2019 mana nke a bụ nke mbụ Onye bụbụ Onyeisiala mba Amerịka ọzọ na-aga ịzara ọnụ ya n’ọgbaka ndị omeiwu kamgbe Gerald Ford mere ya n’afọ 1983.

    Ọzọ bụ na Bill Clinton na Hillary Clinton kwetere ịbịa zara ọnụ ha dịka ndị omeiwu kwekọtara ime vootu ka a maa ha abụọ ikpe ịda iwu ụlọ omeiwu nke nwereike ime ka a kpụpụ ha ụlọikpe maọbụ tụọ ha nga.

    Akụkọ ọzọ maka ebubo Epstein:

  7. Umu Igbo ndewo nu

    Anyị na-ekele unu maka i sonyere anyí n'ọgbakọ BBC News Igbo taa.

    Ụbọchị taa ga-adịrị gị na mma.

    Biko, sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile.

    Sonyere akara Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na vidio dị icheiche anyị ji bịa taa.

    Ya gazie gị.

  8. Ụlọikpe enyeela iwu ka otu jikọrọ ndị ọrụ ghara igba abụbụọrụ maọbụ ime ngagharịiwe n'Abuja

    Ọkaikpe sị na iwu a ga-adígide tupu anụ mkpesa Nyesom Wike wetara nke ga-abịa n'abalị iri nke ọnwa Febụwarị.

    Ebe foto si, Adekunle Ajayi/NurPhoto via Getty Images

    Nkọwa foto, Ọkaikpe sị na iwu a ga-adígide tupu anụ mkpesa Nyesom Wike wetara nke ga-abịa n'abalị iri nke ọnwa Febụwarị.

    Ọkaikpe Emmanuel Subilim nke ụlọikpe ụlọọrụ mmepụta ihe nke a kpọrọ ‘Industrial court’ enyeela iwu mmachibido otu jikọrọ ndị ọrụ gunyere ‘Nigeria Labour Congress, Trade Union Congress’ nakwa mmadụ atọ ndị ọzọ ime ngagharịiwe maobụ igba abụbụọrụ.

    Cheta na minista na-ahụ maka isi obodo Naịjirịa dị n'Abuja bụ Nyesom Wike tinyere akwụkwọ n’ụlọikpe ka Ọkaikpe kwụsịtụ ndị ọrụ ime ngagharịiwe n'ihi ozi onyeisi otu ndị ọrụ n'Abuja zitere ndị otu ha ka ha pụta maka ime ngagharịiwe nke ha tinyere n’ụbọchị Tuzde abalị atọ nke ọnwa Febụwarị.

    Mgbe Okaịkpe Subilim na-enye iwu a, ọ gwara ndị nchekwa ka ha gbochie ihe ọbụla ga-emebi iwu na usoro n'obodo.

    O mere ka o doo anya na iwu a ga-adịgide tupu ụlọikpe anụ mkpesa Wike wetara nke ọma nke ga-abịa n'abalị iri nke ọnwa Febụwarị.

    Lee akụkọ ọzọ ga-amasị gị

  9. Mba Amerịka na-achọ iweghachite mmekọrịta ha na Mali, Nijel na Burkina Faso

    Cheta na mgbe Joe Biden nọ n'ọchịchị ka ọ kwụsịrị mmekọrịta na enyemaka nchekwa mba Amerịka na-enye mba  Mali, Niger na Burkina Faso kemgbe ndịagha weghaara ọchịchị n'ike mba atọ a.

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Cheta na mgbe Joe Biden nọ n'ọchịchị ka ọ kwụsịrị mmekọrịta na enyemaka nchekwa mba Amerịka na-enye mba Mali, Niger na Burkina Faso kemgbe ndịagha weghaara ọchịchị n'ike mba atọ a.

    Mba Amerịka ekwuola na ọ chọrọ inwe nzuko n’etiti ya na mba Mali, Niger na Burkina Faso iji nwee mkparịtaụka n’ihe gbasara nchekwa na ọnọdụ akụnụba.

    Onyei na-ahụ maka ihe mmetụtara mpaghara Afrịka na mba Amerịka bụ Nick Checker ga-aga njem neleta n'isi obodo Mali bụ Bamako n’ụbọchị na-adịghị anya.

    Cheta na mgbe Joe Biden nọ n'ọchịchị dịka onyeisiala Amerịka, ka ọ kwusịrị mmekọrịta na enyemaka nchekwa mba Amerịka na-enye mba Mali, Niger na Burkina Faso n'ihi na ndịagha mba atọ ahụ weghaara ọchịchị n’ike.

    Ka ọ dị ugbua, ọchịchị Onyeisiala Donald Trump na-atụ anya iweghachi mmekọrịta mba Amerịka na mba atọ ndị a iji hụ na ọnọdụ ọchịchị onye kwuo uche ya lọghachitere na mba ndị ahụ.

    Nke a na-abịa dịka mba Mali, Niger na Burkina Faso gbaketere Fransị azụ ma tinye ihu ha n'ebe mba Rọshịa nọ iji nweta ngwọta maka nsogbu ndị na-eyi ọha egwu na ndị ndị nnupụisi nke Islam na-enye ha.

    Guo akụkọ ndị ọzọ gbasara mba atọ a ndịagha weghaara ọchịchị n'ike:

  10. Trump eyiela egwu ịkpụpụ Trevor Noah ụlọikpe maka iji Epstein akpa ọchị na Grammy

    Onye na-eme ihe ịkpa ọchị na mba Saụt Afrịka nọ na-ahazi emume ihe nrite ugwu maka ndị oti egwu

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onye na-eme ihe ịkpa ọchị na mba Saụt Afrịka nọ na-ahazi emume ihe nrite ugwu maka ndị oti egwu

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump eyiela egwu ịkpụpụ onye na-eme ejije bụ Trevor Noah n’ụlọikpe maka iji Trump na Jeffrey Epstein mee ihe ọchị n’emume ihe nrite Grammy.

    Noah, onye haziri emume ahụ, kwuru sị: "Abụ nke Afọ - nke ahụ bụ Grammy nke onye ọ bụla na-eme ejije chọrọ dịka Trump chọrọ Greenland, nke a bụ ezi uche dị na ya n'ihi na ala Epstein ahụ mmiri gbara gburugburu apụọla, ọ chọrọ nke ọhụrụ iji soro Bill Clinton nọrọ."

    Cheta na a maara na Trump bụ onye mmekọ Epstein ruo ọtụtụ afọ, mana ọ na-ekwu na ọ maghị maka mpụ ya nakwa na ha nwere esemokwu n'ihe dịka afọ 2004.

    Enweghị ihe gosiri na ọ gara n’ala mmiri gbara gburugburu bụ nkeonwe Epstein, a ebobeghịkwa ya ebubo mpụ ọ bụla site n'aka ndị Epstein metụtara. Ngalaba ikpe ziri ezi nke mba Amerịka ekwuola na ebubo gbasara ya bụ ihe ụgha.

    N'afọ 2020, onye na-ekwuchitere Clinton kwuru na onye ahụ bụbu onyeisiala mba Amerịka "agabeghị" n’ala Epstein ahụ mmiri gbara gburugburu, Little St James. E nweghịkwa onye boro Clinton ebubo ime ihe ọjọọ ọ bụla.

    Lee akụkọ ọzọ ga-amasị gị:

  11. Dokubo adọọla aka na ntị megide ịhapụ igwe mmadụ ka ha gbakọọ n’ama egwuregwu Pọtakọt

    Onye na-eme ejije a ma ama bụ Hilda Dokubo

    Ebe foto si, Hilda Dokubo /Facebok

    Nkọwa foto, Hilda Dokubo

    Onye na-eme ejije ma bụrụkwa onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Lebọ pati adọọla aka na ntị banyere imepere ndị nkwado na-esonye Nyesom Wike ama egwuregwu Pọtakọt.

    Dokubo kọwara na imepe ama egwuregwu ahụ bụ ihe nwereike imetuta nchekwa mmadụ n'ihi na a na-emezi ama egwuregwu ahụ emezi.

    Dokubo bụ onye na-etinye ọnụ na nhọtafe dapụtara mgbe ndị na-esonye Wike chọrọ ijiri ama egwuregwu ahụ mee ọgbakọ ma kwuo na nchekwa ndị mmadụ abụghị ihe a ga-eji maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị kpachapụ n’akụkụ.

    Ọ sị na “ọ bụ ndị na-emegide ndị mmadụ na-atụ egwu na a na-emegide ha”.

    N’okwu ya “enweghị onye isi kpakọrọ ọnụ ga-ahapụ igwe mmadụ ka ha nwee ọgbakọ n’ama egwuregwu a ka na-emezi emezi”.

    Gụọ akụkọ ndị ọzọ maka Hilda Dokubo ebe a:

    • Ihe mere m ji azọ ọkwa n'ụlọomeiwu Naịjirịa n'aha Labour Pati - Hilda Dokubo
    • LinkEkwekwala ka onye nọ na Finland nọrọ ebe ahụ na-emetọrọ anyị ala - Hilda Dokubo
  12. Ezinaụlọ Ifunanya Nwangene ekwuola na ha ga-eme nnyocha ‘autopsy’ iji chọpụta ihe gburu ya.

    Foto Ifunanya Nwangene

    Ebe foto si, Ifunanya Nwangene/Facebook

    Ezinaụlọ Ifunanya Nwangene ekwuola na ha ga-eme nnyocha 'autopsy' iji chọpụta kpọmkwem ihe gburu ya.

    Nke a na-abịa dịka ụlọọgwụ Federal Medical Centre (FMC) dị n'Abuja wepụtara akwụkwọ ozi banyere ihe gburu Ifunanya.

    Cheta na akụkọ kwuru na agwọ tara n'ụlọ Ifunanya n'ụlọ ya dị na Cowries Estate, Lugbe, Abuja n'ụbọchị Satọde, 31 Jenụwarị, 2026.

  13. Praịm mịnịsta Keir Starmer nkwenyere na Mandelson kwesiri ịhapụ ụlọomeiwu Lords maka ebubo na o zigaara Epstein ozi gọọmenti

    Foto Keir Starmer bụ Praịm mịnịsta mba UK na Peter Mandelson

    Ebe foto si, Getty Images

    Praịm Mịnịsta mba UK bụ Keir Starmer ekwuola na o kwenyere na Peter Mandelson ekwesighị ịbụ onye otu ụlọomeiwu Houes of Lords maka ebubo kwuru na ya na Jeffrey Epstein nwere mmekọ.

    Keir Starmer enyela iwu ka e mee nnyocha zuruoke iji chọpụta ụdịrị mmekọ Mandelson na Epstein nwere oge ọ bụ mịnịsta gọọmenti mba UK.

    Nke a na-abịa dịka mba Amerịka wepụtara akwụkwọ ozi na-ekwu na Mandelson zigaara Epstein ozi si na gọọmenti oge ọ bụ odeakwụkọ na-ahụ maka ahịa.

    Cheta na Mandelson gbara arụkwaghịm n’abalị Sọnde 1 Febụwarị, 2026 ma kwuo o mere nke a iji gbochie iwetara pati Labour mkparị.

    Akụkọ kwuru na Epstein kwụrụ Mandelson puku dọka iri asaa na ise $75,000 n’afọ 2023 na 2024 mana Mandelson gọnarịrị ebubo ahụ ma kwuo na e kwesiri ime nnyocha iji chọpụta nke bụ eziokwu.

    Akụkọ ndị ọzọ si UK:

  14. E wepụtachala ndekọ Epstein niile?

    Osote onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ikpe ziriezi bụ Todd Blanche

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Todd Blanche

    Osote onyeisi ụlọọru ikpe ziriezi n’Amerịka bụ Todd Blanche ekwuola na ọ ka fọrọ obere ndekọ Epstein e wepụtabeghị.

    Ọ sị na ha na-eche ka ọkaiwu nye ha ikike iwepụta ndekọ ndị ahụ, mana ụlọọrụ na-ahụ maka ikpe kwuru na ụlọọrụ ha akwụsịla ime nnyocha banyere ndekọ ndị ahụ n’ụbọchị Sọnde gara aga.

    N’ụbọchị Fraịde ka o kwuru na ha akwụsịla usoro ịchọpụta na inyocha ndekọ ndị ahụ.

    Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị Demokrat ka na-ekwu na e weputaghị ọtụtụ ndekọ ruru nde abụọ na ọkara.

    Ọzọ bụ na a na-akatọ ụlọọrụ na-ahụ maka ikpe kamgbe ha enweghị ike iwepụta ndekọ Epstein na Disemba 19 afọ 2025 ha kwuru na ha ga-ebido na-ewepụta ya.

    Mana a mabeghị ka ọgbaghara maka ndekọ Epstein akwụsịla dịka ọ ka fọrọ ọtụtụ ndekọ a mabeghị banyere ya.

    Akụkọ ndí ozo gbasara Epstein:

  15. Ahịa na-azụ n'Onitsha Main Market n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Febụwarị 2026

    Nwoke na-agbape ụlọahịa ya na-akpọsa ngwaahịa.

    BBC Igbo mere mkpagharị n'ahịa Onitsha Main Market iji chọpụta ma ndị mmadụ ọ ga-apụta n'ụbọchị Mọnde 02 Febụwarị, 2026.

    Nke a na-abịa dịka Gọvanọ Soludo nyere iwu ka e mepee ahịa ahụ site na mmechi o mechiri ya n'otu izuụka.

    O mechiri ahịa ahụ n'ihi nnupuisi ndị ahịa mere n'iwu ịkwụsị ịnọ n'ụlọ kwa ụbọchị Mọnde ọbụla na steeti ahụ.

  16. Ọkaikpe enyela iwu ka a tọhapụ nwatakịrị dị afọ ise ndị ọrụ ICE nwụchiri na Minneapolis

    A nwụchiri Liam Conejo Ramos dịka ọ nọ n'ihu ụlọ nna ya na Minneapolis

    Ebe foto si, Columbia Heights Public Schools

    Ọkaikpe Fred Biery mba Amerịka enyela iwu ka a tọhapụ nwatakịrị nwoke dị afọ ise ndị ọrụ ICE nwụchiri ma kpọchie na Texas ma katọọ nwụchi ahụ nke o kwuru na o gosiri na ndị ICE na-emetọ ikike e nyere ha. Ndị ọrụ ICE nwụchikwara nna nwa ahụ.

    Ọtụtụ mmadụ malitere ịkatọ nwụchi a nwụchiri Liam Conejo Ramos dịka ya na nna ya Adrian Alexander Conejo Arias n’ihu ụlọ ha dị na Minneapolis.

    Ndị ọrụ ICE gara n’ihu kwuo na ọ bụghị nwatakịrị ahụ ka ha chọrọ iwụchi kama na ha na-enyocha nna ya onye ha kwuru na o nweghị akwụkwọ nyere ya ikike ibi n’Amerịka.

    Akụkọ ndị ọzọ si mba Amerịka:

    Ha kwuru na nna Liam hapụrụ ya gbapụ ọsọ ngwangwa ọ hụrụ ha.

    Ọkaikpe Biery nyere iwu n’ụbọchị Satọde 31 Jenụwarị, 2026 ka a tọhapụ nwatakịrị ahụ dịka ọkaiwu ezinaụlọ ha degaara ụlọikpe akwụkwọ banyere nwụchi ahụ.

  17. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma!

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 1 Febụwarị, 2026.

    Anyị na-asị ka ụbọchị taa na ọnwa ọhụrụ a gara onye niile nke ọma.

    Biko, sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile.

    Sonyere akara Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ maka akụkọ foto na vidio anyị ji bịa taa.

    Ya gazie gị.