Akụkọ ndị kachasị mkpa na mbaụwa n'ọnwa Sepụtemba 2024.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Adline Okere, Ikechukwu Kalu, Jessica Nwankwo, Uche Akolisa, Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Michael Ilediagu
Anyị agaghị emechanwu ihe dị n'idemmiri a n'aka nke anyị
Aka na-achị Borno steeti bụ Babagana Zulum agwaala BBC na ndị ide mmiri metụtara na Maiduguri nwereike ịgafe nde abụọ.
O kwukwara na ezi ọnụọgụgụ ndị nwụrụ na ya bụ ọdachi ga-apụta ihe ma mmiri ahụ kpọọchaa dịka o ji nwayọ nwayọ akọ.
Dịka ihe si kwụrụ, nchọpụta na nzọpụta ka jisiike aga ihu ugbua dịka dam Alau gbawara abalị ole ma ole garta aga ma bute ide mmiri kacha njọ na steeti ahụ kemgbe afọ atọ.
N'agbanyeghi na ndị mmadụ gbapụrụ n'ụlọ ha maka ya ma gbaga n'ogige ebe ha ga-enweta enyemaka ma, ọ ka nwere ọtụtu ndị tọrọ n'ime ụlọ n'ime ime obodo.
Zulum kwuru na ọ gaghị ezu ezu ịnye ndị mmadụ ha etu ahụ nri naanị otu elekere maọbụ abụọ.
"Ihe anyị na-agba mbọ ị me bụ ịkpọpụta ndị mmadụ n'ogige ebe ha ga-enweta enyemaka maka anyọ achọghị ka ndị mmadụ nwụọ maka na enyemaka eruteghi ha aka n'oge." ka o kwuru.
Ihe niile na-akpọtụ n'Edo steeti dịka a na-akwado ntuliaka ọkwa Gọvanọ
Ebe foto si, Inecnigeria/x
Ọ bụ n'ụbọchị 21 nke ọnwa Septemba ka ọ ga-achaji n'Edo steeti dịka ha ga-eme ntuliaka ọkwa Gọvanọ ebe ahụ.
Kemgbe amalitere ịdọ ihe dị na ya bụ ntuliaka, ọtụtụ ihe apụtala na ya bụ okwu.
Ma achụmnta vootu, ma ndị gara ụlọikpe, ma ndị forot ntutu taa na a ga-agbanwe Kọmịshọna ndị uweojii nakwa onyeisi Inec na steeti ahụ, lee ihe niile dị mkpa na-eme na steeti ahụ.
- Ụlọikpe kpebiri na Olumide Akpata na-anọchị anya otu Labour Party bụ onye ritere ya bụ ọkwa n'ezie. Ndị ọkaikpe atọ n'ikpe ahụ ji otu obi kachapụ akwụkwọ Kenneth Imansuangbon gbara ịkwapu Akpata n'oche ahụ.
- "A na m ahụ ntuliaka ọgbaghara ga-emebi" - Gọvanọ Obaseki
Aka na-achị Edo steeti ugbua bụ Godwin Obaseki agbaruola ihu maka ihe ọ kpọrọ mmegbu otu ya bụ PDP na-agabiga n'aka ndị uweojii.
Ọ kwuru nke a dịka agbakọrọ ibinye aka na nkwekọrịta 'peace accord' ụnyaahụ n'Edo steeti. O katọrọ nwụchi ndị uweojii nwụchiri ndị otu ya ma mee ka ndị rie mbọmbọ ọsọ. "E jighi m n'aka na ndị uweojii ga-echekwa anya ọfụma na ntuliaka a na-abịa" ka o kwuru.
- PDP kpọrọ oku ka agbanwee Kọmịshọna ndị uweojii na onyeisioche Inec n'Edo.
Tony Aziegbemi bụ onyeisioche otu PDP n'Edo steeti esorola nzọmụkwụ onye otu ya bụ Gọvanọ Godwin Obaseki ịti mkpụ maka ebubo ịkpa oke n'aka ndị uweojii.
Na nzụkọ ibinye aka na nkwekọrịta udo e mere ụnyaahụ, Aziegbemi kwuru na anwụchiri ọtụtụ ndị otu ha ma jụ ịgwa ndị ezinaụlọ ha ebe ha nọ ma zuru ha gaa Abuja n'ime abalị.
Onyeisi ndị uweojii bụ Kayode Egbetokun zaghachiri ya sị "ọ bụrụ na ị nwụchi ma chụọ ndị gburu onye uweojii ọsọ bụ anyị ịkpa oke, maara na anyị ka ga-ejigide echiche ahụ".
Kemgbe idemmiri wakporo ma mebie ọtụtụ ihe n’obodo Azuoto dị n’Abakaliki, Ebonyi steeti ndị o metụtara na-arịọ gọọmenti steeti ahụ nakwa nke etiti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka.
Ndị ọrụ ugbo bụ ndị mmịrị ahụ mebiri ihe ha kọrọ n’ugbo jikọtara aka ọnụ dee akwụkwọ ha ji arịọ maka enyemaka degara ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata n’Ebonyi steeti bụ Steeti Emergency Management Agency, SEMA.
Amauche Agbo bụ ode akwụkwọ Azuoto Village Youth Assembly binyere aka n’akwụkwọ ozi ahụ wee na-arịọ ka gọọmenti gbatara ha ọsọ enyemaka, nye ha ego nakwa akụrụngwa ha ga-eji kwadoo ndụ ha.
“Nke a ga-enye aka beleta ọnọdụ ọjọọ mmiri ahụ zoro malite n’ọnwa Julaị ruo na Septemba tinyere anyị”.
“Anyị nọ na nnukwu oke agụụ na ihe isiike maka ihe mmiri ahụ mebiri n’ugbo anyị”.
Ndị ọzọ kwuru okwu dịka Sunday Igwe, Simon Nwogha na Ngozi Ofoke na-arịọ gọọmenti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka.
Cheta na obodo Azuoto nakwa ndị ọzọ dịka Mbeke Ishieke na Onuenyim na-enwe nsogbu afọ niile mmiri zoro nke ukwuu nke na-akpata mmiri ji esi na osimiri Oto na osimiri Ebonyi mebie ihe n’obodo ndị ahụ dị icheiche.
Gọọmentị Borno steeti ekesawala enyemaka nye ndị ide mmiri metụtara
Ndị obodo Maiduguri ka nọ n'oke ide mmiri mebiri ọtụtụ ihe ma chụpụ ọtụtụ mmadụ n'ụlọ ha.
Gọọmenti steeti ahụ kwuru na ọdachi a metụtara ihe ruru mmadụ otu nde.
Amalitela ikesa ngwa enyemaka nye ndị ihe ahụ metụtara na Maiduguri dịka ebidola ịbupu ozu ndị mmiri gbagburu na mpaghara ebe ahụ.
Cheta na anụmanụ ndị nọ n'ogige anụmanụ gbapụrụ maka ide mmiri dịka ndị nọkwa n'ụlọ mkpọrọ gafere 200 gakwuru ọsọ maka ide mmiri ahụ.
Unu abọọla chi?
Daalụ nụ maka isonye anyị taa.
Akụkọ ndị kachasị mkpa taa na Naịjirịa bụ ide mmiri chụpụrụ ndị mmadụ na Maiduguri Borno steeti.
Anyị ga-ewetara unu akụkọ si ebe ahụ n'ụtụtụ a nakwa ndị ọzọ na mba ụwa niile.
Udo!
Lee ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ Edo steeti na etu ha si kwado
Ebe foto si, Monday Okpebholo/Olumide Akpata/Asue Ighodalo/Facebook
Kemgbe ụlọọrụ na-ahazị ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Independent National Electoral Commssion (INEC) weputara otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị tozuru ịzọ ọkwa gọvanọ n'Edo steeti, mmadụ atọ kacha ada ụda ma bụrụkwa ndị a kacha kpụrụ n’ọnụ.
Ka onye ọbụla na-echere ka ụbọchị Satọde, abalị iri abụọ n’otu, n’ọnwa Septemba, 2024 rue; ndị na-eme ịchụ nta vọọtụ na-ada ụda gunyere LP, PDP na APC.
Lee ndị ha bụ ma lee ka ha si kwado ya bụ ntuliaka
Olumide Akpata (LP)
Olumide Akpata ji ọkọrọtọ otu ọchịchị Labour Patị azọ ya bụ ọkwa.
Olumide dị afọ iri ise na otu.
Ọ bubu onyeisi otu jịkọrọ ndị ọkaịwụ (Nigeria Bar Association).
Olumide kwụsịrị ịzọ ọkwa ọzọ dịka onyeisi NBA n’afọ 2023 ka o nwe ike zọọ ọkwa Gọvanọ Edo Steeti n’afọ 2024.
Ihe kacha mkpa na nkwa Olumide kwere:
-
-Ọ ga-agba mbọ ịhụ na onye ọbụla weta ikpe ziriezi n’ụlọikpe
-Ọ ga-ebuli ọnọdụ ụlọọgwụ, tinye akụrụngwa ọhụrụ ma dozie ngalaba na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata n’ụlọọgwụ.
-Ọ ga-ebuli ego e ji akwado ụlọakwụkwọ na nka na ụzụ nke ga-eme ndị ha zụpụtara na-achọ ọrụ akwụrụ chịmchịm dịka ogbo ha na mba ụwa niile.
-Ọ ga-eme ka usoro ọchịchị gọọmentị bụrụ ihe na-agaghị enwe mkpuchi ma kwụwa aka ọtọ.
Asuerinme Ighodalo (PDP)
Asuerinme Ighodalo ji Peoples Democratic Party dị afọ iri isii na ise.
Ọ bụ onye ọkaịwụ.
Ọ bụ onye ma ihe gbasara azụmahịa, ọ kachasị iwu metutara azụmahịa.
Nkwa kacha mkpa Ighodalo kwere gunyere:
-Ọ ga-enye ndị ruru puku iri ise bụ ndị ihe na-esiri ike ego ruru N20,000 kwa ọnwa.
-Ọ ga-arụ ụzọ ruru 2,000km na mpaghara dị icheiche na steeti ahụ.
-Ọ ga eme ka gburugburu ha dị mma site n’ịkọ osisi ruru 500,000 n’afọ nke mbụ ma bulie ọnụ ọgụgụ osisi ahụ ka o ruo osisi 1,000,000 n’afọ nke abụọ.
-Ọ ga-eme ka ime obodo ruru 500 na steeti ahụ nwee ezigbo mmiri ọṅụnụ
Monday Okpebholo (APC)
Monday Okpebholo ji ọkọrọtọ ndị APC na-azọ ọkwa gọvanọ n’Edo steetị dị afọ iri ise na atọ.
Ọ bụ onye ji ego achụ ego.
Ugbua ọ bụ sịnatọ na-anọchịta anya ndị mpaghara etiti Edo n’ụlọomeiwu Nịjirịa.
-Ọ ga-ahazi agụmakwụkwọ site n’ime ka ha nweta ego ịgụakwụkwọ n’efu, itinye anya n’ụgwọ akwụkwọ nakwa inye ndị enweghị ego ohere ịgụ akwụkwọ n’efu.
-Ọ ga-eme ka ndị steeti ahụ site na ndị na-achọ ọrụ ma bụrụ ndị na-enye ọrụ.
-Ọ ga-ahazi ọnọdụ nchekwa sita n’iji Edo state Security Fund were na-echekwa ndị ọrụ ugbo, ndị na-azụ ahịa, ndị ji ego achụ ego na ndị niile bi na steeti ahụ.
Ụlọikpe enyela Bristol hiwere PIDOM beelụ
Aha onyonyo, Ụlọikpe ukwu etiti dị n’Abuja enyela Isaac Bristol na-ahụ maka PIDOM Nigeria beelụ.
Ụlọikpe ukwu
etiti dị n’Abuja enyela Isaac Bristol na-ahụ maka PIDOM Nigeria beelụ.
Ọ bụ Ọkaikpe
Emeka Nwite nyere ya beelụ ahụ n'ụbọchị Fraịde 27 Septemba 2024.
A na-ekpe
Bristol ikpe maka ebubo ịgba Naịjirịa mgba okpuru nke gụnyere ebubo ịkpọkọta ndị
mmadụ ma na-akpọ oku nkwado ịkwanye gọọmenti ọkụ n’ahụ site na ngagharịiwe
#EndBadGovernance.
E bokwara
ya ebubo ikwu okwu ụgha megide Onyeisiala Bola Tinubu gbasara nrụrụakaego
tinyekwara inweta na ikesa ozi bara oke uru n’ụzọ iwu megidere.
Ụlọikpe eyigharịala ụbọchị a ga-anụrụ maka ntọhapụ onye nwe PIDOM
Ọkaikpe
Emeka Nwite nke ụlọikpe ukwu etiti dị n’Abuja ekwupụtala abalị 27 Septemba 2024
dịka ụbọchị a ga-achabi ikpe n’akwụkwọ ịna beelụ nke onye otimkpu Naịjirịa bụ
Isaac Bristol, onye a na-ekwu na ọ bụ ya na-ahụ maka PIDOM Nigeria.
A na-ekpe
Bristol ikpe ugbua maka ebubo ịgba Naịjirịa mgba okpuru nke gụnyere ebubo ịkpọkọta
ndị mmadụ ma na-akpọ oku nkwado ịkwanye gọọmenti ọkụ n’ahụ site na ngagharịiwe #EndBadGovernance.
E bokwara
ya ebubo ikwu okwu ụgha megide Onyeisiala Bola Tinubu gbasara nrụrụakaego
tinyekwara inweta na ikesa ozi bara oke uru n’ụzọ iwu megidere.
Ndị ọkaiwu
na-ekwuchitere ya bụ Abubakar Marshal na Deji Adeyanju gbara ụkwụ megide ụfọdụ
mpaghara ebubo ndị ahụ ma kwuo na ebubo ịgba Naịjirịa mgba okpuru bụ nke
na-enweghị ebe ọ gbakwasara ụkwụ.
Oge ọ ṅachara
ntị n’olu ndị okwu ahụ metụtara, Ọkaikpe Nwite yigharịrị ikpe ahụ ka ọ bụrụ n’abalị
27 Septemba 2024 maka ịchabi ikpe n’arịrịọ beelụ ya.
Ndị a nwụchiri na ngagharịiwe ga-eji N10m gbapụta onwe ha n'otu n'otu - Ụlọikpe
Ụlọikpe
ukwu dị n’Abuja enyela iwu ka mmadụ iri ahụ a nwụchiri n’oge ngagharịiwe ‘EndBadGovernance’
jiri nde naịra iri (N10m) gbapụta onwe ha n’otu n’otu.
Nke a
na-abịa mgbe mmadụ iri a wụchiri n’ihu Ọkaikpe Emeka Nwite n’ụbọchị Wenezde 11 Sepụtemba
2024 maka mkpesa banyere ntọhapụ ha.
Na nchabi
ikpe ahụ, Ọkaikpe Nwite kwuru na ọ bụ eziokwu na ebubo ndị dị n’isi ha dị egwu
kama na ọ ga-atọhapụ ha n’ọnọdụ ndị gụnyere;
Mmadụ
iri a ga-eji nde naịra iri (N10m) gbapụta onwe ha n’otu n’otu.
Ha
ga-akpọta onye ga-etinye aka n’akwụlwwọ mgbapụta n’otu n’otu, na onye ahụ
ga-enwe ala n’Abuja.
Na ndị a
agaghị eme ngagharịiwe ọzọ maọbụ kwuo okwu n’ebe ọha gbakọtara.
Mana otu n’ime ndị ọkaiwu na-ekwute ọnụ ha bụ Abubakar Marshalrịọrọ ụlọikpe ka ọ tọhapụ mmadụ 39 ọzo bụ ndị a kaji ji eji n’ụlọmkpọro a na-akpọpụtabeghi n’ụlọikpe.
Ọkaikpe gwara ya na ikpe banyere ndị a anọghị n’ụlọikpe.
E bugharịrị ikpe ahụ gawa n’ụbọchị 27 Septemba mgbe a ga-amalite ikpe ya n’uju.
Cheta na Gọọmentị etiti site n'aka ndị uweojii nwụchiri ndị a n'oge ngagharịiwe n'ọnwa Ọgọst ma bo ha ebubu "ibu agha megide ọchịchị obiodo".
Ọtụtụ ndị e
ji eji n’ụlọmkpọrọ dị na Maiduguri nke Borno Steeti esila n’ụlọmkpọro gbafuo
mgbe idemmiri na-akpa ebe ahụ kwaturu mpaghara ụlọmkpọrọ ahụ.
Akụkọ kwuru
na ndị mkpọrọ ọnụọgụgụ ruru 200 ka a na-achọ achọ ugbua ebe a na-eche na mmiri
eriela ụfọdụ n’ime ha.
Ụlọọrụ
na-ahụ maka ichekwa ụlọmkpọro bụ Nigerian Correctional Service (NcoS) ekwuola
na na-agba mbọ ịchịkwalata ọdachi a mere n’ụlọmkpọro ha.
Ọnụ
na-ekwuru ha bụ Umar Abukakar kwuru na ha na-agba mbọ ịkpọpụta ndị a nọ na nga
ma kpọga ha n’ebe ọzọ mana o kwughi banyere akụkọ na ụfọdụ ndị a gbara ọsọ.
Idemmiri a
metụtakwara ebe nlereanya ụmụanụmanụ dị na Maiduguri, gbuo ọtụtụ ụmụanụmanụ ebe
ndị ọzọ na-akpagharị n’ụzọ.
Onyeisiala Bola
Tinubu agwala ụlọọrụ gbata gbata National Emergency Management Agency NEMA ka
ha nyere ndị niile idemmiri metụtara aka ma zọpụta ndị a site n’ebe idemmiri a
mere.
Osote
Onyeisiala bụ Kashim Shettima gakwara njem nleta na Maiduguri bụ ebe idemmiri a
mere.
Ọ kwere ndị
mmadụ nkwa na gọomentị ga-ewete ogbugbo nsogbu banyere idemmiri n’uju.
Ihe ndị gbapụtara ihe na nrụrịtaụka Harris na Trump
Aha onyonyo, Ọkpụrụkpụ ihe dapụtara na mkparịtaụka Trump na Harris
Ọ bụrụ na ịkiribeghị ya pịa aka n'elu ka i kirie ya.
Ebe foto si, Getty Images
Mmadụ abụọ
na-azọ ọkwa Onyeisiala mba Amerịka bụ Kamala Harris na Donald Trump nwere nrụrịtaụka
n’etiti ha n’ụbọchị Tuzde 10 Sepụtemba 2024.
Nrụrịtaụka
a bụ nke ụlọọrụ mgbasaozi ABC haziri nke e mere na steeti Philadelphia mba Amerịka
weere nkeji 90’.
Harris na
Trump ji ohere ahụ gwaa ndị mba Amerịka ọrụ ndị ha ga-arụgasị ma ọ bụrụ na a họpụta
ha na ntuliaka ọnwa Nọvemba.
N’otu aka
ahụ ha dụrịtara onwe ha aka n’ọnụ ma kọọkwa ọnụ banyere iwu ha, agwa ha nakwa
ihe ndị ọzọ.
Ha rụrịtara
ụka a n’isiokwu ndị dịka akụnaụba, iwu itepụ ime, iwu mmachị okeala ha, iwu
banyere ibu egbe nakwa ihe ndị ọzọ.
Ebe foto si, EPA
Lee ihe ndị gbapụtara ihe na nrụrịtaụka ha
Kamala Harris na Donald Trump boro onwe ha ebubo ịtụ asị na nrụrịtaụka mbụ ha n’ịzọ ọkwa Onyeisiala mba Amerịka nke 2024.
Na mpịachi, Harris kwuru na ọ na-elekwasị anya n’ọdịnihu mba Amerịka dịka Trump kwuru na Amerịka bụzi “mba na-akụ afọ n’ala” n’ọchịchị ndị Democrats.
N’okwu banyere Isreal, Trump kwuru na agha agaghị ada ma ọ bụrụ na ọ nọ n’ọchịchị ebe Harris kpọrọ oku ka e nwee ngalaba ọchịchị abụọ na mba Isreal (two-state solution).
Ka nrụrịtaụka ahụ gachara, otiegwu mba Amerịka a ma ama bụ Taylor Swift kwadoro Harris n’ozi o wepụtara n’akara Instagram ya ma kpọọ ya “onyendu nwere onyinye”.
N’okwu banyere iwu itepu ime, Trump kwuru na o weghachịrị iwu ahụ ka steeti ọbụla kpebie ihe ha chọrọ ebe Harris kwuru na mmachi itepu ime megidere ikike nlekọta ụmụnwaanyị.
Harris gwara Trump na Putin bụ “onyendu ọjọọ ga-elomi ya n’abalị” ebe Trump kpọrọ ya “Osote Onyeisiala kachasị njọ kamgbe ọchịchị mba Amerịka”.
Igbo ndị ọma ndewo nụ!
Anyị ji obiọma anabata gị n'ọgbakọ anyị bụ BBC Igbo taa.
Bịa gụrụ akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa gbaa gburu gburu.
Nwoke ahụ gburu Rebecca Cheptegei anwụọla
Ebe foto si, Alamy
Nkọwa foto, Rebecca Cheptegei
Nwoke ahụ gburu onye egwuregwu Rebecca Cheptegei nke
mba Yuganda anwụọla site n’ọkụ gbara ya oge ọ mụnyere Rebecca Cheptegei ọkụ n’izu
gara aga.
Nwoke ahụ aha bụ Dickson Ndlema bụbu enyi nwoke
Rebecca Cheptegei, wakporo Rebecca Cheptegei n’izuụka gara aga oge o si ụlọụka
alọghachite, wụọ ya mmanụ ụgbọala ma munye ya ọkụ.
Akụkọ kwuru na Dickson na Rebecca nwere ala dị na mpagahara
ugwu Kenya ha abụọ na-azọ. Ala ahụ bụ ebe Rebecca bi ma bụrụ ebe ọ na-anọ
akwado onwe ya n’egwuregwu ịgba ọsọ.
Ụlọọgwụ Moi Teaching and Referral Hospital ebe Dickson
Ndlema nọ na-enweta nleta, gwara BBC na Dickson nwụrụ n’abalị Mọnde 9 Septemba,
2024.
Ha kwuru na ọkụ ahụ metụtara akụkụ ahụ iku ume Dickson
Ndlema.
Onye ọrụ ụlọọgwụ ahụ bụ Consolota Rop kwuru na ha
agwaala ezinaụlọ Dickson na ọ nwụọla ma kwuo na ha ga-ewepụta ozi zuruoke maka ọnwụ
ya n'oge na-adịghọ anya.
Ebe foto si, Moi Teaching and Referral Hospital
Ide mmiri achụpụla puku mmadụ n’ụlọ ha na Borno Steeti
Ebe foto si, Getty Images
Ide mmiri achụpụla puku mmadụ n’ụlọ ha na Maiduguri,
isi obodo Borno steeti ka ọdọ mmiri Alau Dam tiwara.
Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị ihe ahụ metụtara gbagara n’ogige
ndị gbara ọsọ ndụ iji nweta chekwa ka ihe ahụ mere..
Kọmishọna na-ahụ mgbasaozi na steeti ahụ bụ Usman Tar
kpọkuru ndị niile bi n’ogige ọdụ mmiri ahụ tiwara hapụ ebe ahụ iji chekwaa onew
ha na ezinaụlọ ha.
Ka ọ dị ugbua, gọọmenti Borno steeti emechiela ụlọakwụkwọ
niile dị na steeti ahụ ruo izuụka abụọ.
Ụlọọrụ gbatgbata bụ National Emergency Management
Agency (NEMA) kwuru na ha amalitela ibupu ndị ide mmiri ahụ metụtara.
Ozi onyeisi ụlọọrụ NEMA bụ Zubaida Umar wepụtara n’akara
soshal midia X ya kwuru na ụlọọrụ ya amalitela inwepụta ịkwado ndị ihe ahụ metụtara
site na inye ha nri, ebe obibi na ọgwụ.
Ebe ide mmiri ahụ kachasị metụta gunyere Shehuri,
ogige ebe obibi dị na GRA, Gambomi, Budum, Bulabulin, Adamkolo, Millionaires
Quarters, ogige ahịa Monday na Gwange.
NEMA kwuru na gọọmenti Borno steeti emepeela ogige ndị
gbara ọsọ ndụ Bakassi iji nye ndị o mmiri ahụ metụtara nleta.
Harris na Trump ga-arụrịtaụka maka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka
Ebe foto si, Getty Images
Nrụrịtaụka
n’etiti ndị na-azọ ọkwa Onyeisiala bụ ihe dị oke mkpa na ndọrọ ndọrọ mba Amerịka.
Nke ga-eme taa
bụ nke ga-adị n’etiti Donald Trump na Kamala Harris – bụ nke a nwereike ikpebi
onye ga-emeri na ntuliaka.
Nrụrịtaụka
a ga-adị ma ọ kụọ elekere itoolu nke abalị Tuzde n’oge mba Amerịka nke bụ
elekere abụọ nke isi ụtụtụ Wenezde n’oge Naịjirịa.
Joe Biden kụrụ
afọ n’ala na nrụrịtaụka e mere n’ọnwa Juun bụ nke mere ka akwanye ọkụ n’ike
mere o jiri gbaa arụkwaghịm n’ịzọ ọkwa ahụ.
Na-agbanyeghi
na Kamala Harris abụrụla osote Onyeisiala kamgbe afọ atọ ma bụrụ onye na-azọ ọkwa
Onyeisiala kamgbe izuụka asaa, mana ọtụtụ ndị mmadụ amatabeghi ya ọfụma.
Ọtụtụ ndị ga-atụ
vootu n’ọnwa Nọvemba kwuru na ha ga-achọ ịmata onye Harris bụ ọfụma dịka nyocha
e mere si gosi.
Mmadụ abụọ
na-azọ ọkwa akwadola maka nrụrịtaụka ụbọchị Tuzde a n’ụzọ dị iche iche.
Dịka nrụrịtaụka
ga-abụ ohere iji mee ka oge ntuliaka na mba Amerịka kpụrụ ọkụ n’ọnụ, ọ ga-abụkwa
ohere ikpeazụ ndị a na-azọkwa nwereike iji rite mkpụrụobi ndị ga-atụ vootu.
James Earl Jones nwafọ mba Amerịka na-eme ihe nkiri anwụọla
Ebe foto si, Getty Images
Nwafọ mba
Amerịka na-eme ihe nkiri bụ James Earl Jones a ma ama dịka olu gụpụtara ihe
onyonyo Star Wars villain Darth Vader anwụọla dịka ọ gbachara afọ 93.
Ọ nwụrụ n’ụtụtụ
ụbọchị Mọnde n’etiti ezinaụlọ ya bụ gbara ya gburu dịka Berry McPherson si
kwuo.
Jones mere ọtụtụ
ihe nkiri gụnyere, ‘Field
of Dreams, Coming To America, Conan the Barbarian na The Lion King. A ma ya dịka onye
nyere ihe nkiri ‘Star Wars’ olu pụrụiche.
Mark Hamil bụ onye nọrọ ka nwa ya n’ihe nkiri ‘Star
Wars’depụtara “Laa nke ọma nna” dịka o
kwupụtara ọkwa ọnwụ ya.
N’oge ọ na-eme ihe nkiri, Jones nwetere nturuugo atọ gụnyere
‘Emmys na Grammy, tinyere nkwanye ukwu Oscar n’afọ 2011.
Ebe foto si, Getty Images
N’afọ 1971 ọ bụụrụ onyeisi ojii nke abụọ a ga-ahọpụta maka nturuugo ‘onye kachasị eme ihe nkiri.
Ọtụtụ ndị ogbo ya n’ime ihe nkiri akwanyerela ugwu site n’ikwupụta etu nwamadị a si bụrụ onye ọma.
Ndị a gụnyere Kevin Costner, Octavia Spencer, Crystal Minkoff na ndị ọzọ.
Olu Jones bụ ihe a na-anụ na ngụpụta ọkwa ụlọọrụ mgbasaozi CNN nke na-ekwu “This is CNN”.
Ụlọọrụ CNN kwanyekwara ya ukwu site n’iwepụta ozi.
A mụru ya na Mississippi n’ọnwa Jenụwarị afọ 1931, o kwuru na ọ gaghị akọwaala ọtụtụ ihe mere mgbe ọ dị obere maka ịsụ nsụ.
O kwuru na o nwetere olu a pụrụiche dịka ọ na-agba mbọ ijikwa onwe ya banyere nsụ ahụ.
Ndị ọrụ nchekwa DSS atọhapụla Joe Ajaero, onyeisi NLC
Ebe foto si, NLC/DSS/X
Ngalaba
nchekwa nzuzo nke Naịjirịa bụ Department of State Services (DSS) atọhapụla
onyeisi otu Nigeria Labour Congress (NLC) bụ Joe Ajaero.
Nke a dị n’ozi
otu NLC wepụtara n’akara soshal midia X ha n’ime abalị ụbọchị Mọnde.
Ajaero gwara ụlọọrụ mgbasaozi Channels TV na ndị ọrụ nchekwa tọhapụrụ ya n’ihe dịka elekere iri na otu (11pm) nke abalị Mọnde.
Onyeisi ndị
NLC kwuru na ndị a gbagidere ya ajụjụ ọnụ ruo ihe dịka awa iri na ise (15hrs)
kamgbe elekere asaa a nwụchiri ya n’ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe International
Airport dị n’Abuja.
Mana Ajaero
kwuru na ndị ọrụ nchekwa a kpachiri akwụkwọ njem ya bụ ‘passport’.
O kwuru na
agbanyeghi na ọ bụ ndị DSS nwụchiri kama na ndị uweojii bịara n’ụlọọrụ DSS dị n’Abuja
gbaa ya ajụjụọnụ maka ngagharịiwe #EndBadGovernance e mere na Naịjirịa n’ọnwa Ọgọst.
O kwuru na
a gbakwara ya ajụjụọnụ banyere ịkwado iyi ndụ egwu nke metụtara nwafọ mba
Briten bụ Andrew Wynne.
Ebe foto si, NLC/X
Cheta na onyendu ndị ọrụ Bekee a nọ na-eme njem ịga mba Briten n’ụbọchị Mọnde maka ọgbakọ ndị ọrụ Bekee mgbe a nwụchiri ya n’ọdọụgbọelu dị n’Abuja.
Otu NLC adịla mbụ katọọ nwụchi a nwụchiri Ajaero ma nye ndị ọrụ nchekwa ruo ụbọchị Tuzde ka ha tọhapụ ya.
Otu a mekwara ka ngalaba ha dị iche iche na Naịjirịa nọrọ na njidere maka mkpebi ọbụla ha nwereike ime ma ọ bụrụ na a tọhapụghị onyeisi ha.
Ọtụtụ otu nakwa ndị na-ahụ maka ikike dịịrị onye katọrọ Gọọmentị etiti maka nwuchi Ajaero ma kpọọ oku ka a tọhapụ ya.
Ụmụibe unu asaala chi?
Daalụ maka ịnọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo.
Anyị na-arịọ ka ị nọsie ebe ike ma gụrụ akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ala Igbo, Naịjirịa nakwa mbaụwa.
Ndewo!
Gọvanọ Soludo achụghị onye ọbụla n'ọrụ maka egwu ‘gwo gwo gwo ngwo’ - Ụlọọrụ Gọọmenti Anambra Steeti
Ebe foto si, Chukwuma Soludo/Facebook
Gọọmenti Anambra Steeti ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ha
chụrụ onye ọrụ gọvanọ Chukwuma Soludo maka inwepụta ihe vidio gosịrị ebe gọvanọ
Soludo na-agba egwu ‘gwọ gwọ gwọ ngwọ’
Onye odeakwụkwọ Gọvanọ Chukwuma Soludo bụ Christian
Aburime kwuru nke n’ozi o wepụtara nke katọrọ okwu ụgha ahụ.
Ozi ahụ gara n’ihu kwuo na egwu ahụ Gọvanọ Soludo
gbara bụ nke ọtụtụ ndị ntorobịa na ọtụtụ ndị nkwado ya hụrụ n’anya.
Aburime kpọkuru ndị na-ekesa ozi ụgha ahụ ka ha kwụsị
ya ma sonyere gọọmenti Gọvanọ Chukwuma Soludo iji mee ka Anambra steeti bụrụ ọkaibe n’etiti steeti ndị
ọzọ na Naịjirịa.
NLC akpọọla oku ka a tọhapụ onyeisi ha a nwụchiri
Ebe foto si, NLC/X
Otu Nigeria Labour Congress akpọọla oku ka a tọhapụ
onyeisi ha bụ Joe Ajaero ndị ọrụ DSS nwụchiri.
Ozi onyeisi mgabsaozi NLC bụ Benson Upah kwuru na enweghị
ihe ọbụla Joe Ajaero mere nke kpatara nwuchi ya ma kọwaa nwụchi ahụ dịka nke
megidere iwu.
Ọ gara n’ihu kwuo na nwụchi Ajaero gosiri na gọọmenti
onyeisiala Bola Tinubu achọghị ọdịmma ụmụafọ Naịjirịa.
NLC kpọrọ oku ka a tọhapụ Joe Ajaero na ndị ọzọ a nwụchiri
maka ebubo dị icheiche.
Ka ọ dị ugbua, otu NLC ekwuola na ha na-eme ọgbakọ ma
kwuo na ha ga-eme ka ọhaneze mara mkpebi ha.
Cheta na ndị ọrụ Department of State Services (DSS) nwụchiri
onyeisi Joe Ajaero n’ọdụ ụgbọelu dị n’Abuja ka ọ na-aga ọgbakọ otu Trade Union
Congress na-amalite na London taa, 9 Septemba, 2024.