Ndịagha Amerịka batara Naịjirịa bụ maka ikwalite ikike ndịagha Naịjirịa imeri ndị na-eyi ọha egwu - DHQ

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'izu a.

Nchịkọta

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Amerịka na Izrel awakpola Ịran dịka Tehran zaghachiri mwakpo ahụ

    N'okwu ha, Onyeisiala Donald Trump ma Praịm Minista Izrel bụ Benjamin Netanyahu kwuru na Iran bụ ihe ize ndụ nyere mba ha - Trump kwuru na ọ bụ ihe ize ndụ zuru ụwa ọnụ.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, N'okwu ha, Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump na Praịm Minista Izrel bụ Benjamin Netanyahu kwuru na Iran bụ ihe ize ndụ nyere mba ha - Trump kwuru na ọ bụ ihe ize ndụ zuru ụwa ọnụ.

    Onyeisiala Donald Trump ekwuola na Amerịka na mba Izrel awakpola mba Ịran ma kwuo na agha na-aga n’ihu dịka ọ na-akpọ oku ka a gbanwee ọchịchị.

    Ebe mwakpo ahụ metụtara gụnyere ụlọọrụ onyeisi kachasị n’Ịran, obi ọchịchị Onyisiala nakwa ọtụtụ ogige ndịagha dị na mba Ịran.

    Akụkọ kwuru na ihe ruru mmadụ 53 nwụrụ n’ụlọakwụkwọ ụmụnwaanyị.

    N’aka nke ọzọ, Ịran kwuru na ha amalitela ịzaghachi mwakpo Izrel wakporo ha. Ndịagha Izrel kwuru na ha ahụla ọtụtụ ụlọ nakwa ihe ndị ọzọ mebiri na Qatar, UAE na Kuwait ma kwuo na ha nkwenyere na ọ bụ Ịran wakporo ebe ndị ahụ.

    Onyeisiala Trump akpọọla oku ka a gbanwee ọchịchị n’Ịran mana ọtụtụ ndị mba Ịran ekwenyecheghị na oku Onyeisiala Trump kpọrọ.

    Gụọ akụkọ ndị ọzọ ebe a:

    Ebe bụ ụfọdụ ebe ndị kpọkashiri dịka Amerịka na Izrel  tụrụ ogbunigwe  na Iran

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ebe bụ ụfọdụ ebe ndị kpọkashiri dịka Amerịka na Izrel tụrụ ogbunigwe na Iran
  2. Ndịagha Amerịka batara Naịjirịa bụ maka ikwalite ikike ndịagha Naịjirịa imeri ndị na-eyi ọha egwu - DHQ

    DHQ kwuru na ọbịbịa ndịagha Amerịka a agaghị efụ gọọmenti Naịjirịa ego ọbụla

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, DHQ kwuru na ọbịbịa ndịagha Amerịka a agaghị efụ gọọmenti Naịjirịa ego ọbụla

    Isi ụlọọrụ nchekwa Naịjirịa (DHQ) akọwaala na enyemaka Amerịka nyere Naịjirịa na nso nso a site n’izite ndịagha ha emebighị ikike mba Naịjirịa kama ọ bu ikwalite ikike ndịagha Naịjirịa iji merie ndị na-eyi ọha egwu.

    Ụlọọrụ DHQ gara n’ihu kwuo na mmekọrịta ahụ bụ nke ziri ezi ma baa uru maka mbọ ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-agba maka imegide ndị na-eyi ọha egwu.

    Nke a na-abịa dịka ọtụtụ akụkọ kwuru na ndịagha mba Amerịka ruru otu narị batara Naịjirịa n’ụbọchị Mọnde 17 Febụwarị, 2026.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ DHQ bụ Ọchịagha Micheal Onoja kwuru na ndị mmadụ e kwesịghị ịghọtahie ihe ndịagha Amerịka bịara ime ma kọwaa na ọ bụ njiko ndịagha na ndịagha.

    O mere ka o doo anya na mmekọrịta ahụ bụ nke a na-eme ọkachasị n'etiti mba nwere nsogbu banyere nchekwa.

    Cheta na e nwere mgbe ndị ọchịchị Naịjirịa na ndị Amerịka nwere nzuko gbasara ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ na Naịjirịa.

    Nke a bịara dịka Onyeisiala Amerịka bụ Trump nyere iwu ka ndịagha Amerịka tụọ ogbunigwe na Sokoto steeti n'ọnwa Disemba 2025.

    Gụọ akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a:

  3. Ụlọikpe akwadola ọgbakọ kọnvenshọn PDP mere n'Ibadan nke họpụtara Turaki dịka onyeisioche ha

    Ọkọlọtọ pati PDP

    Ebe foto si, @officialKolaO/X

    Ụlọikpe Ukwu Oyo steeti dị n'Ibadan akwadola ọgbakọ kọnvenshọn otu pati Peoples Democratic Party (PDP) mere n’Ịbadan isiobodo steeti ahụ n’ọnwa Nọvemba 2025 ebe ha nọ họpụta Kabiru Tanimu Turaki dịka onyeisioche pati ahụ.

    Ọkaikpe Ladiran Akintola kwadoro ọgbakọ ahụ ma kwuo na PDP rubere isi nye iwu Naịjirịa nakwa iwu ntuliaka Naịjirịa.

    Cheta na nke a na-abịa dịka ụlọikpe ahụ kagburu ọgbakọ kọnvenshọn ahụ ma kwuo na e mere ya n’ụzọ megidere iwu.

    Ka ọ dị ugbua, ụlọikpe ahụ enyela onyeisioche Independent National Electoral Commission (Inec).

  4. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nu.

    Anyị na-asị unu nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde 28 Febụwarị, 2026.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ foto na onyonyoo dị iche iche ga-amasị gị.

    Nnọọ!

  5. A tụọla onye bụbu onye ọrụ Ụlonnochite Amerịak na Bokina Faso nga mkpụrụ ọka maka imetọ ụmụaka

    Ụlọnnochite Amerịka

    Ebe foto si, US Embassy/Facebook

    Otu nwaafọ Amerịka aghọọla onye a tụrụ nga mkpụrụ ọka maka imetọ ụmụaka nwaanyị na-eto eto oge ọ na-arụ ọrụ n'Ụlọnnochite Amerịka na mba Bokina Faso.

    Fode Sitafa Mara gbara afọ 41, onye Maryland bụ onye a mara ikpe ka e kpechara ya ikpe izuụka abụọ, dịka ngalaba Amerịka na-ahụ maka ikpe si kwuo.

    A mara ya ikpe maka imetọ obere nwa nakwa ịlara nwata n'aka ịgba mbọ igbochi ka e nweta ikpenkwụmọtọ

    Akwụkwọ a gbara ya so na atụmatụ nke ngalaba ikpe(Justice Department) malitere n'afọ 2006 a kpọrọ 'Safe Childhood' iji gbaa ịmetọ ụmụaka mgba.

  6. E gbuola ndị Gana mmadụ 55 n’agha Rọshịa na Yukren – Ka Minista kwuru

    Minista mba ofesi na Yukren, Andrii Sybiha‎ na onye otu ya na mba Ghana, Samuel Okudzeto Ablakwa, na-akwanyeere ndị nwụrụ n'agha ahụ ugwu.

    Ebe foto si, Ghana's Foreign Affairs Ministry/Facebook

    Nkọwa foto, Minista mba ofesi na Yukren, Andrii Sybiha‎ na onye otu ya na mba Ghana, Samuel Okudzeto Ablakwa, na-akwanyeere ndị nwụrụ n'agha ahụ ugwu.

    Minista na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi na Gana ekwuola na opekatampe mmadụ iri ise na ise anwụọla n'agha dị n’etiti Yukrenn a Rọshịa, ebe ha jidere mmadụ abụọ ndị ọzọ ugbu a dịka ndị mkpọrọ agha.

    Samuel Okudzeto Ablakwa kwuru n’oge njem ya n’isi obodo Kyiv, na a kwenyere ihe dịka mmadụ narị abụọ na iri asaa na abụọ ndị Gana ịbanye n'ọgbaaghara ahụ kemgbe afọ 2022, dịka ndị ọchịchị Yukren si kwuo.

    Ablakwa kọwara ọnụọgụgụ ndị a dịka "ihe mwute na ihe na-atụ egwu," na-ekwu na Gana "enweghị ike ileghara ọnụọgụgụ ndị a na-agbawa obi anya".

    Mana o kwughị akụkụ onye ndị Gana ahụ na-enyere aka ịlụ ọgụ mana minista mba ofesi nke Yukren kwuru na Wenezde na a kpọọrọ ihe karịrị mmadụ out puku na narị asaa si mba dị iri atọ na isii dị n'Afrịka ka ha lụchitere ndị Rọshịa ọgụ n’agha ahụ.

    Lee akụkọ ọzọ ga-amasị gị

  7. Pakistan awakpola Afghanistan dịka Praịm Minista ha kwuru na ndịagha ha dị njikere 'igwepịa' ndị Taliban

    Ndịagha ikuku nke Pakistan tụrụ ogbunigwe n'isi obodo Afghanistan n'ụtụtụ a mgbe ọtụtụ ọnwa nke agha mmegwara maka nsogbu ogologo nke okeala ugwu ha.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndịagha ikuku nke Pakistan tụrụ ogbunigwe n'isi obodo Afghanistan n'ụtụtụ a mgbe ọtụtụ ọnwa nke agha mmegwara maka nsogbu ogologo nke okeala ugwu ha.

    Mba Pakistan awakpola isi obodo Kabul nke Afghanistan dịka mwakpo dị iche iche na-aga n'ihu n’ofe mba ahụ, dịka onye ọrụ gọọmentị siri kwuo.

    Mwakpo ndị Pakistan ahụ mere n’ụtụtụ Fraịde 27 Febụwarị bụ mgbe ndị Taliban nke Afghanistan kwupụtara mwakpo dị ukwuu megide ebe ndịagha Pakistan dị nso n’okeala ha n'abalị Tọzde.

    Ka esemokwu na-arị elu, Praịm Minista Pakistan kwuru na mba ahụ nwere "ike zuru oke iji kụpịa ọchịchọ ọ bụla siri ike", ebe Minista nchekwa kwupụtara "agha doro anya" megide ndị Taliban nke Afghanistan.

    Mana onye na-ekwuchitere ndị Taliban nke Afghanistan kwuru n’akara X na ha azaghachila site na mwakpo ọhụrụ megide ndịagha Pakistan – agbanyeghị na ha ehichapụla ozi ahụ ugbu a.

    Onye na-ekwuchitere gọọmentị Taliban bụ Zabiullah Mujahid, gwara BBC na ndịagha Afghanistan emebiela ebe dị iche iche dị na Pakistan gụnyere okeala iri na itoolu ma jidekwa ọtụtụ ndịagha Pakistan.

    O kwukwara na e gbuola ihe karịrị ndịagha Pakistan mmadụ iri ise.

    Ka ọ dị ugbua, minista na-ahụ maka mba ofesi kwuru na mba Chaịna "nwere nnukwu nchegbu" gbasara esemokwu na-akawanye njọ n'okeala Afghanistan na Pakistan, na-akpọ akụkụ abụọ ahụ ka ha "dozie esemokwu ahụ site na mkparịtaụka na nkwekọrịta".

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  8. Gọvanọ Fubara eduola odeakwụkwọ gọọmentị steeti na onyeisi ndị ọrụ ọhụrụ n’iyi ọrụ

    Gọvanọ Fubara gwara ndị ọrụ ọhụrụ ahụ ka ha ghara itinye aka n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

    Ebe foto si, Siminalayi Fubara/Facebook

    Nkọwa foto, Gọvanọ Fubara gwara ndị ọrụ ọhụrụ ahụ ka ha ghara itinye aka n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

    Aka na-achị Riva Steeti bụ Siminalayi Fubara, eduola Dagogo Wokoma n’iyi ọrụ dịka odeakwụkwọ gọọmentị steeti ahụ (SSG) na Sunny Ewule dịka onyeisi ndị ọrụ, ma gwa ha ka ha ghara itinye aka n’ihe gbsara ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

    Gọvanọ Fubara kwuru nke a mgbe ha ṅụchara iyi ọrụ nke mere awa ole na ole ka e kwupụtachara nhọpụta ha, na-ekwu n’ọkwa ha gbakwasịrị ụkwụ na nchịkwa na ịrụrụ ndị mmadụ ọrụ.

    Fubara dụkwara Onyeisi Ndị Ọrụ ọdụ ka ọ ghara ịkpọ nzukọ ndị ya enyeghị ikike maọbụ itinye aka n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-enweghị nkwado ya, ma na-ekwusi ike n’ọkwa ahụ bụ iji jee ozi dịka onye enyemaka ya na ịkwado ebumnuche ọchịchị ya.

    Ọ kọwara nhọpụta ndị a dịka oku maka ọrụ karịa ịkwado ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na-ekwu na a na-atụ anya na ndị ọrụ abụọ ahụ ga-enyere aka mee ka ọchịchị sie ike na steeti ahụ.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  9. Ụtụtụ ọma, ndị be anyị.

    Anyị na-asị unu nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 27 Febụwarị, 2026.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ foto na onyonyoo dị iche iche ga-amasị gị.

    Ndewo!

  10. Ụlọikpe ga-amalite nnyocha banyere ọnwụ nwa nwoke onye odee akwụkwọ Chimamanda Adichie

    Chimamanda na dị ya na-ebo ebubo na ọnwụ nwa ha nwoke bụ n'ihi nleghara anya ahụike na mmejọ ndị ọkachamara.

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Chimamanda na dị ya na-ebo ebubo na ọnwụ nwa ha nwoke bụ n'ihi nleghara anya ahụike na mmejọ ndị ọkachamara.

    A ga-amalite nnyocha maka ọnwụ nwa nwoke onye odee akwụkwọ a ma ama na Naịjirịa bụ Chimamanda Ngozi Adichie dị ọnwa iri abụọ na otu n'ụlọikpe dị na Legọs.

    Ụlọikpe Maji dị na Yaba Legọs steeti, ndịda ọdịda anyanwụ Naịjirịa, ewepụtala ụbọchị 14 nke ọnwa Eprel afọ 2026 maka mmalite ikpe maka ọnwụ Maazị Nkanu Nnamdi Esege, onye nwụrụ na Jenụwarị mgbe ọ natara ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ abụọ nkeonwe dị na steeti ahụ.

    Ọkaikpe Atinuke Adetunji bugara ikpe ahụ n’ọnwa Eprel n'oge ikpe ahụ mbidoro n’ụbọchị Wenezde, wee nye ndị niile so n’ikpe ahụ ka ha tinye akwụkwọ maka ndị akaebe tupu a malite ịnụ ikpe ahụ.

    Cheta na Nkanu, nwa Adichie na di ya bụ Dọkịnta Ivara Esege, nwụrụ na Jenụwarị 7, 2026 mgbe e nyechara ya nlekọta ahụike na Atlantis Hospital n’usoro nchọpụta ọrịa n’ụlọọgwụ Euracare Multi-Specialist Hospital dị na Legọs. Dịka akwụkwọ ndị e tinyere n'ụlọikpe si kwuo, a kpọgara nwatakịrị ahụ n'ụlọọgwụ Atlantis na mbụ n'ihi ọrịa ya nke na-akawanye njọ mana ọ dị obere na mbido.

    A na-eme atụmatụ ibuga ya n’ụlọọgwụ dị n’Amerịka maka ọgwụgwọ ọzọ na Johns Hopkins Hospital tupu o nwee nwụọ.

    Mana ndị mụrụ ya na-ebo ebubo na ọnwụ nwa ha nwoke bụ n'ihi nleghara anya ahụike na mmejọ ndị ọkachamara.

    Ọkaikpe Adetunji kwuru na ebumnuche nke nnyocha ahụ bụ ịchọpụta ihe kpatara ọnwụ ahụ, na-ekwusi ike n’ime nnyocha ozu bụkarị ebe mmalite nke ikpe ndị dị otu a.

    Gụọ akụkọ ọzọ ga-amasị gị:

  11. Ndị omeiwu Sinetị ezutela ndị ọrụ JAMB maka nsogbu ụgwọ ule na ụmụakwụkwọ nọ n'ime obodo ịbanye mahadum

    Ndị omeiwu Sinetị gwara ụlọọrụ JAMB ka ọ melite nhazi ga-eme usoro ule mbanye mahadum dị mfe

    Ebe foto si, Nigerian Senate/Facebook/JAMB/X

    Nkọwa foto, Ndị omeiwu Sinetị gwara ụlọọrụ JAMB ka ọ melite nhazi ga-eme usoro ule mbanye mahadum dị mfe

    Kọmitii ndị omeiwu Sineti na-ahụ maka ụlọakwụkwọ mahadum na ego enyemaka agụmaakwụkwọ TETFund ezutela ndị ọrụ nke ụlọọrụ na-ahụ maka ule mbanye mahadum bụ Joint Admissions and Matriculations Board (JAMB) n’ụbọchị Wenezde.

    Ndị omeiwu ahụ rụtụrụ aka na nsogbu gbasara ụgwọ ule, arụghị ọrụ nke akụrụngwa kọpụta eji ede ule, na oghere ịnweta agụmakwụkwọ mahadum, karịsịa maka ụmụakwụkwọ nọ n'ime obodo.

    N'oge nnọkọ ahụ, otu onye omeiwu bụ Sinatọ Amos Yohanna kwupụtara maka ihe ọ kọwara dịka ibu arọ ụgwọ ego na-arị elu n'ahụ ụmụakwụkwọ n'agbanyeghị nsogbu akụ na ụba.

    Yohanna jụkwara ụlọọrụ ahụ ka ha kọwaa ihe kpatara ụgwọ ego ụmụakwụkwọ na-akwụ maka ule ahụ, na-ekwu na ogbenye na ihe isiike na-echere ọtụtụ ezinụlọ aka mgba.

    Ndị omeiwu kwupụtara ihe ịma aka teknụzụ ndị na-eme n'oge na-adịbeghị anya mgbe ụmụakwụkwọ na-agbalị ịbanye na weebụ saatị nke ụlọọrụ JAMB, ma na-arịọ ndị isi ụlọọrụ ahụ ka ha kọwaa ihe ndị ha na-eme iji mee ka usoro ahụ dịkwuo mfe maka ụmụakwụkwọ nwereike ịga n'ihu na-edebanye aha maka ịbanye mahadum.

    Onyeisi Kọmitii ahụ bụ Mohammed Dandutse gwara ụlọọrụ JAMB ka ọ melite nhazi ga-eme usoro ule mbanye mahadum dị mfe dịka ụmụakwụkwọ na-enwe nsogbu ịnweta oghere ịbanye na mahadum.

    Lee akụkọ ọzọ ga-amasị gị ebe a:

  12. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nu.

    Anyị na-asị unu nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọzede 26 Febụwarị, 2026.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ foto na onyonyoo dị iche iche ga-amasị gị.

    Udo dịrịkwa gị!

  13. Etu usoro njem ọhụrụ mba Briten ga-esi metụta ndị mbịarambịara

    ọdọụgbọelu Garwick nke  mba Briten

    Mba Briten etinyela usoro njem ọhụrụ malitere taa bụ Wenezde nke ga-emetụta ndị na-abata si mba dị iche iche n'ụwa mba ahụ

    Atụmatụ ahụ nke gọọmentị ha kpọrọ electronic travel authorisation (ETA) na Bekee bụ ihi hazie mbịara mbịara Mana ọ ga-enye ndị bụ ụmụaamala ha ma nwekwa ikike dịka aụmụamala mba ndị ọzọ.

    N'usoro ọhụrụ ahụ, onye ọbụla nwere akwụkwọ ikike ịbụ nwaafọ Briten na nwaafọ mba ọzọ iji maa atụ nke Naịjirịa, agaghị abatali Briten belusọ ma o nwere akwụkwọ a kpọrọ 'Certificate of Entitlement”, na-agbanyeghị na o nwere akwụkwọ gosiri na ọ bụ nwaafọ Briten nke Bekee kpọrọ “British passport”.

    Ihe nke a pụtara bụ na ọ bụrụ na iji akwụkwọ mba abụọ mana i mere njem pụọ Briten, ị gaghị enwe ike ịlọghachi Briten.

    Ọzọ bụ na ọtụtụ ndị nwere akwụkwọ ikike ị bụ nwaamala mba Briten enweghị mgbe ha tinyere akwụkwọ inweta akwụkwọ.

    Nke ọzọ bụ na ọ abụghị ihe ọ ga-abụ itinye akwụkwọ enye gị ya ozugbo ozugbo.

    Briten na-ere ETA ego dị paụnds iri na isii (£16) mana ha ga-ebugo ọnụ ego ya ihe dịka ego paụnds iri abụọ (£20) n’ọdịnihu.

    Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị bụ ụmụaamala Briten ma bụrụkwara ụmụ amaala Naịjirịa nwere ike ha agaghị alọghachi azụ na Briten mgbe na-adịghị anya.

  14. Ọkụ agbaala n'ahịa abụọ n'Anambara steeti

    Ọkụ gbara na Nwafor Plaza dị n'Ọka

    Ebe foto si, Screengrab

    Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ọkụ ọgbụgbaala emebiela ahịa ndị nde kwuru nde naira n'ebe abụọ n'Anambra steeti ụbọchị Tuzde.

    Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọkụ gbara ọdọahịa anọ na Nwafor Plaza, dị nso na UNIZIK Junction, n'Ọka, isiobodo Anambara steeti n'ebe Elekere 11 nke abalị Tuzde.

    O nwebeghị onye ma ihe butere ọkụ ahụ bụ nke ndị ọrụ mgbanyụ bịara menyụọ.

    Na nke yiri ya, ọkụ ọzọ gbakwara n' okporo 'Igiligi Lane' dị nso na 'Godwill Junction', n'Okpuno, Ọka n'otu abalị ahụ.

  15. Gọvanọ Soludo ehiwela otu ga-eleba anya n’esemokwu dí n’oche ọchịchị Eze Uzun nke Awka

    Ụmụnwoke anọ na otu nwaanyị ndị ga-eleba anya n'oche ọchịchị Eze Uzu nke Awka

    Ebe foto si, Mazi Ejimofor Opara/Facebook

    Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo ihiwela otu ga-eme nnyocha banyere esemokwu dị n’oche ọchịchị Eze Uzu nke Awka.

    E hiwere otu a n’ụbọchị Tuzde 24 Febụwarị, 2026 n’ụlọọrụ gọọmentị dị n’Awka.

    Ndị so n’otu a bụ Paul Obidigwe bụbu Ọkaikpe ukwu gọọmentị Anambra Steeti dịka onyeisi ha na ndị ọzọ gụnyere; Ọkammụta Kate Omenugha – odeakwụkwọ, Eze Ben Emeka (Igwe Umueri), Ọkaiwu Nnaemeka Francis Patrick Egonu, Fada Maurice Izunwa.

    Gọvanọ gwara ndịa ka ha mee nnyocha tara ọchịchị maka ihe butere nsogbu n’oche ọchịchị Eze Uzu.

    The Governor charged the Commission to conduct a thorough, impartial, and comprehensive inquiry into the issues that have led to tensions over the revered traditional stool.

    Chọpụta ma ọ chụchụ a chụrụ Gidson Nwosu n’ọbi ọchịchị Eze Uzu nke abụọ ma o so usoro iwu kwadoro.

    Chọpụta ma ntinye e tinyere Austin Ndigwe n’oche ọchịchị Eze Uzu ọ bụ ihe iwu kwadoro.

    Tụọ arọ dị mma nye Gọọmenti Anambra Steeti maka usoro e nwereike iji kwụsị esemokwu dị maka oche ọchịchị ahụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  16. Gọọmenti Naịjirịa agbaala Ọkaiwu Mike Ozekhome akwụkwọ ikpe ọhụrụ

    Foto Ọkaiwu Mike Ozekhome

    Ebe foto si, Mike Ozekhome/X

    Gọmenti Naịjirịa agbaala Ọkaiwu Mike Ozekhome akwụkwọ ikpe ọhụrụ n’ụlọikpe maka ebubo iri na abụọ.

    Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ Independent Corrupt Practice and Other Related Offences Commission (ICPC) kagburu ikpe atọ mbụ ha gbara ya n’ụlọikpe n’ụbọchị Tuzde 24 Febụwarị, 2026.

    Akwụkwọ ikpe ahụ kwuru na gọọmenti boro Mike Ozekhome na Ponfa Useni e ji Tali Shani mara ebubo ịkpa nkata ma zụta akwụkwọ njem passpọt Naịjirịa adigboroja nke ọ bụ aha Tali Shani dị na ya iji zụta ụlọ dị Nuk n’afọ 2020.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  17. Peter Obi na pati ADC akatọọla APC maka mwakpo ha wakporo ya n’Edo Steeti

    Foto Peter Obi na foto njirmara ADC

    Ebe foto si, Peter Obi/ADC/X

    Peter na ndịisi pati African Democratic Party (ADC) akatọọla pati All Progressives Congress (APC) nọ n’ọchịchị maka mwakpo ha wakporo ha n’Edo Steeti n’ụbọchị Tuzde 24 Febụwarị, 2026.

    Obi kọwara mwakpo ahụ dịka ihe ịma aka nye ọchịchị onyekwuouche ya na Naịjirịa ma kwuo na ya ga-agba mbọ ịchọpụta ndị kpara ajọ agwa ahụ.

  18. Ụtụtụ ọma ndị be anyị

    Anyị ji obi ụtọ anabata gị n'ọgbakọ BBC News taa bụ Wenzede 25 Febụwarị, 2026 ma bụrụkwa ahịa Eke.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na vidio dị iche iche ga-amasị gị.

    Ya gazie!

  19. Gọọmenti Naịjirịa akwụghị ụgwọ maka mgbapụta ụmụakwụkwọ St Mary’s Catholic School dị na Naịja steeti – Mohammed Idris

    Minista na-ahụ maka mgbasaozi na Naịjirịa bụ Mohammed Idris

    Ebe foto si, Mohammed Idris/Facebook

    Nkọwa foto, Minista na-ahụ maka mgbasaozi na Naịjirịa bụ Mohammed Idris

    Gọọmenti Naịjirịa akatọla akụkọ na-efegharị na mpaghara mba ahụ nke kwuru na Gọọmenti Etiti kwụrụ nnukwu ụgwọ n'aka ndị omekome tupu ha atọhapụ ụmụakwụkwọ St Mary’s Catholic School dị na Naịja Steeti.

    Minista na-ahụ maka mgbasaozi na Naịjirịa bụ Mohammed Idris kwupụtara n'ozi nke o binyere aka na akụkọ ahụ nke ndị ntaakụkọ mba ofesi dere abụghị eziokwu, kama ọ bụ ebubo ụgha.

    Dịka o si kwuo, akụkọ ahụ bụ nke na-akwatu mmụọ na mbọ ndị nchekwa Naịjirịa na-agba kwa ụbọchị iji chekwaa ndị Naịjirịa.

    “O nweghị ụgwọ ọ bụla Naịjirịa kwụrụ. O nweghị ndị omekome a tọhapụrụ.”

    Ụlọọrụ ndị nchekwa dị iche iche na Naịjirịa ekwuola na ebubo ahụ enweghị eziokwu dị n’ime ya.

    Gụọ akụkọ ndị ọzọ ebe a:

  20. Etu ụmụnwoke atọ na-ekpocha olulu mmiri ‘well’ si nwụọ na Rivas steeti

    Ndị bi gburugburu ebe ahụ kwuru na olulu mmiri ahụ na-esi isi ọjọọ nke ukwuu tupu ihe ahụ emee

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị bi gburugburu ebe ahụ kwuru na olulu mmiri ahụ na-esi isi ọjọọ nke ukwuu tupu ihe ahụ emee

    Obodo a na-akpọ Aminigboko dị n’ Abua, n’okpuruọhịhị Odual na Rivas Steeti banyere n’oke nwute na obi mgbawa n’ụbọchị Sọnde 22 Febụwarị 2022 maka ọnwụ ụmụnwoke atọ na-ekpocha olulu mmiri bekee kpọrọ ‘Well’ n’obodo ahụ.

    Ndị uweojii kwuru na ihe mere nwereike ịbụ gaasị kpatara ya.

    Ozi ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Grace Iringe-Koko wepụtara kwuru na olulu mmiri ahụ bụ nke a dịghị eji eme ihe kemgbe.

    O kwuru na onye nwe olulu mmiri ahụ chọrọ iji ya na-eme ihe nke mere o ji chọọ ka e kpochaa ya mana ndị bịara ikpocha zutere ọnwụ ha.

    Dịka o siri kwuo, “Aminigboko, bụ ụlọọrụ na-emepụta mmanụ na gaasị n’obodo a na-akpọ Abua bụ ebe ụlọọrụ Shell Petroleum Development Company (SPDC) na-egwupụta mmanụ na gaasị.

    O kwuru na ihe na-eme n’obodo ahụ gosiri na o nwereike ị bụ na gaasị dị n’ime ala ebe ihe ahụ mere.

    Akụkọ kwuru na nwoke mbụ jiri steepụ e wuru n'ogbe banye n'olulu mmiri ahụ mana ọ pụtaghị ọzọ. Mgbe ọ zaghị, nwoke nke abụọ rịdatara iji zọpụta ya ma onye nke abụọ ahụ a lọghachighịkwa.

    E kwuru na nwoke nke atọ, onye na-esughị bụrụ onye ọrụ banyere n'olulu mmiri ahụ n'ike iji zọpụta mmadụ abụọ ndị ọzọ. N'agbanyeghị ịdọ aka na ntị sitere n'aka ndị hụrụ ihe merenụ bụ ndị gwara ya ka o leba anya n'ihe gbasara nchekwa, o gara n'ihu ma mechaa nwụọ.

    Ndị bi gburugburu ebe ahụ kwuru na olulu mmiri ahụ na-esi isi ọjọọ nke ukwuu tupu ihe ahụ emee.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: