Onye nnọchiteanya Amerịka ekwuola na Afrịka dị Trump mkpa n’agbanyeghị nkwụsị enyemaka

Ebe foto si, Reuters
Nnukwu onye ndụmọdụ mba Amerịka maka okwu ndị metụtara Afrịka bụ Massad Boulos ekwuola na onyeisiala mba ha bụ Donald Trump ji Afrịka kpọrọ ihe dị oke mkpa.
Ọ sịrị na nke a bụ n’agbanyeghị nkwụsị enyemaka buterela ọnọdụ gbatagbata gburugburu mba Afrịka.
N’ụbọchị mbụ Trump banyere n’ọkwa n’ọnwa Jenụwarị ka o kwuputara nkwụsị enyemaka ahụ.
E nweela ụjọ na nkwekọrịta azụmaahịa dị n’etiti Amerịka na Afrịka nwereike ịbịa n’isi njedebe n’ihi ụtụisi Trump tinyere na ngwaahịa na nso nso a.
Ka o sinadị, Boulos gwara BBC Newsday sị na Afrịka dị Trump “ezigbo mkpa” ma kụsasịa ụfọdụ akụkọ a na-ebugharị na mba Amerịka na-eme atụmatụ imechi ụfọdụ atụmatụ ndị ha nwere n’Afrịka.
“O ji Afrịka na ụmụafọ mba Afrịka kpọrọ ihe bara uru,” ka Boulos gbakwunyere.


















