AFCON: Lee ka o si aga n'Egypt Tọọzde na foto

Onye nchịkọta otu Super Eagles bụ Gernot Rohr na ndị ọrụ ya ndị ọzọ zochiri n'ama egwuregwu Alexandrian dị na mba Ijipt ile asọmpị ndị Madagascar na ndị Burundi gbara ụbọchị Tọọzde.

Nkọwa foto, Gernot Rohr zochiri n'ama egwuregwu Alexandria, na mba Ijipt
Nkọwa foto, Gernot Rohr na ndị nchịkọta ndị ọzọ ka ha na-ekiri asọmpị ndị Madagascar n'ama egwuregwu Alexandria, na mba Ijipt iji kwado maka asọmpi ha na ndị Naijiria ụbọchịụka
Nkọwa foto, Ndị ọrụ nchịkọta ha na Gernot Rohr na-arụkọ
Nkọwa foto, Ndị egwu bọọlụ na-amasị bịara ile asọmpị Madagascar na Burundi ụbọchị Tọọzde ebe Madagascar ji otu ọkpụ asataghị ihe were merie