Christmas seasons greetings: Etu ndị a ma ama si agba ekeresimesi nke 2021

Ndị a ma ama kwadoro akwado maka emume ekeresimesi nke afọ 2021 a. Lee ihe BBC Igbo hụrụ.

Ebe foto si, Instagram/Obi Cubana

Nkọwa foto, Obinna Iyiegbu a ma dịka Obi Cubana, nwunye ya na ụmụ ya kwadoro ọfụma maka ekeresimesi afọ a.

Ebe foto si, Instagram/ccsoludo

Nkọwa foto, Chukwuma Soludo bụ onye zọtara ọkwa gọvanọ Anambra steeti, nwunye ya, ụmụ isii ha na nkịta ha so n'emume ekeresimesi nke afọ a.

Ebe foto si, Tony Elumelu/Facebook

Nkọwa foto, Ojiegoachụego nakwa ide ji ego bụ Tony Elumelu na ezinaụlọ ya kere ekike yiri ibe ya wee na-agba ekeresimesi nke afọ a.

Ebe foto si, Instagram/Jnrpope

Nkọwa foto, Onye ejije Nollywood bụ Junior Pope Odonwodo, nwunye ya na ụmụ ya jikekwara ejike.

Ebe foto si, Instagram/Cristiano

Nkọwa foto, Lee etu Cristiano Ronaldo bụ ọgbabọọlụ Manchester United na ezinaụlọ ya gụnyere ụmụ ya, nwunye ya nakwa nne na nna ya si agba ekeresimesi nke afọ a.

Ebe foto si, Instagram/Chief Imo

Nkọwa foto, Ọkpaọchị na onye ejije Longinus Anokwute a ma ama dịka Chief Imo na ezinaụlọ ya na-ebunye ụkpa ekele ekeresimesi.

Ebe foto si, Instagram/Stan Nze

Nkọwa foto, Stan na Blessing Nze bụ ndị ejije na Nollywood na-agba ekeresimesi mbụ ha dịka di na nwunye.

Ebe foto si, Instagram/Destiny Etiko

Nkọwa foto, Destiny Etiko bụ onye ejije Nollywood a ma ama. Lee etu o si kwado emume ekeresimesi nke afọ a.

Ebe foto si, Faceboo/Regina Daniels

Nkọwa foto, Onye ejije Nollywood bụ Regina Daniels na Munir Nwoko nwa ya nwoke pụtara n'ọgbọ.

Ebe foto si, Facebook/Hillary Clinton/Bob Mcneely

Nkọwa foto, Hillary na Bill Clinton chịburu mba Amerịka so n'emume ekeresimesi.

Ebe foto si, Facebook/Ike Ekweremadu

Nkọwa foto, Sinetọ Ike Ekweremadu bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị, nwunye ya na nne ya so na-agba ekeresimesi nke afọ a.

Ebe foto si, Instagram/Ighalojude

Nkọwa foto, Ọgbabọọlụ Odion Ighalo Jude na ụmụ ya kere ekike maka emume ekeresimesi

Ebe foto si, Instagram/Mimiorjiekweng

Nkọwa foto, Mimi Orjiekwe bụ onye ejije Nollywood na nwa ya nwaanyị.

Ebe foto si, Instagram/UchennaNnanna

Nkọwa foto, Uchenna Nnanna bụ onye ejije Nollywood, di ya na ụmụ ya kwadoro akwado na foto a.

Ebe foto si, Instagram/babarex

Nkọwa foto, Ome ejije Nollywood bụ Nosa Rex na ezinaụlọ ya sokwa n'ihe a na-eme.

Ebe foto si, Instagram/Nuella_njubigbo

Nkọwa foto, Nuella Njubigbo bụ onye ejije Nollywood na nwa ya nwaanyị na-eme emume ekeresimesi

Ebe foto si, Instagram/AnitaJoseph8

Nkọwa foto, Anita Joseph na-eme ejije na Nollywood na di ya na-enwe aṅụrị ekeresimesi.

Ebe foto si, Instagram/potus

Nkọwa foto, Joe Biden bụ onyeisiala mba Amerịka na Jill nwunye ya sokwa pụta n'ọgbọ ekeresimesi.

Ebe foto si, Instagram/Official_mercyeke

Nkọwa foto, Mercy Eke bụ nwaanyị mbụ na-emeri Big Brother Naija sokwa n'ihe a na-eme

Ebe foto si, Instagram/chachaekefaani

Nkọwa foto, Ome ejije Cha Cha Eke Faani, Austin di ya na ụmụ ha niile so pụta n'ọgbọ

Ebe foto si, Instagram/mercyjohnsonokojie

Nkọwa foto, Mercy Johnson Okojie bụ onye ejije na Nollywood, di ya na ụmụ ya kwadoro akwado pụta n'ọgbọ n'afọ a.