Coronavirus Response: "Ihe mere coronavirus ejighị kpa ike n' Afrika ka mba ofesi " - Esther Osemwegie

Aha onyonyo, Coronavirus: Ihe m hụrụ n'ịgwọ ndị nwere ọrịa Covid-19 - Nurse

Ọrịa coronaviru ataala isi ọtụtụ ndị dọkịnta, ndị nọọsụ na ndịọrụ ahụike ndị ọzọ.

Mana akụkọ a ga-adị ka aja mbele ma ọ bụrụ na i jibeghi anya gị hụ onye o metụrụ.

Esther Osemwegie, onye na-arụ ọrụ dịka nọọsụ n'obodo oyibo kọro, BBC Igbo ihe o jirila anya ya hụ.

O kwuru na ịgwọ ndị coronavirus dị ka onye agha nọ n'ọgbọ ọgụm o nwere ike ịnwụ n'oge ọbụla.

Ihe niile a ọ gabigara mere o ji dee akwụkwọ nke o kwuru na ọ chọrọ iji kụzie ọtụtụ ihe ma dọkwaa ndị mmadụ aka na ntị.

Ndị mere akụkọ a Uche Akolisa