Palm Sunday: Lee etu Ụka Holy Ghost Enugwu si mee Ụka Ọmụ 2019

Ndị Ụka Kraist n'uwa niile gbaa gburu gburu na-eme mmemme Ụka Ọmụ tata.

Nkọwa foto, N'ụka ọmụ n'Ụka Holy Ghost n'Ogui, Enugwu, Ụkọchukwu Ambrose Ofordile kwuru na Izu Ụka Dị Asọ a bụ oge onye otu kraist ọbụla kwesịrị iji nyochaa onwe ya rịọ Chukwu mgbaghara maka njọ
Nkọwa foto, Ndị Ụka Kraist n'uwa niile gbaa gburu gburu na-eme mmemme Ụka Ọmụ tata.
Nkọwa foto, Ụka Ọmụ bụ iji cheta ka Jeso siri baa Jerusalem n'elu nwa Ịnyịnya tupu akpọdo ya n'elu obe
Nkọwa foto, Tata na-amalite Izu- Ụka Dị Asọ nke ndị Ụka Katọlịk ma bụrụkwa ụka ikpeazụ tupu Kraist ebilie n'ọnwụ
Nkọwa foto, Ndị gara Ụka Ọmụ na Holy Ghost Enugwu
Nkọwa foto, Agọziri ọmụ a ga-ejị mee mmemme Ash wednezde na afọ na-abịa abịa
Nkọwa foto, Ụmụaka sokwa n'ihe a na-eme