2019 Elections: Buhari adaghị ntụliaka n'Enugu, edere ya ede - Mbaka

Aha onyonyo, 2019 Elections: Buhari adaghị ntụliaka n'Enugu edere ya ede - Mbaka

Ụkọchukwu a ma ama bụ Reverend Father Ejike Mbaka, ekwuola na ndị Enugwu kwesịrị idenye Buhari vootu gbagotara n'ọnụọgụgụ karịa oke e nyere ya.

Mbaka boro ebubo na ndị Enugwu ji aka ha denye Buharị ọnụọgụgụ na-ebughi ibu, ma kwuo na obi dị ya ụtọ na Buhari mechara merie na ntuliaka, "ihere wee bụrụ nke ndị iro ya".

Ebe foto si, AMEN/Getty

Nkọwa foto, Mbaka kwuru na ọ bụrụ na Atiku na Peter Obi atụnyereghị ụlọụka ya , ha nwere ike ị da na ntuliaka na-abịa

Mbaka gwara Ayogu Eze sị ya ntọọ, na ọ gwara ya ka ọ ghara ịzọ ntuliaka dịka gọvanọ, mana o geghi ya ntị.

Ebe foto si, Adoration Ministry/ Getty Images

Ọ gwara Ayogu Eze na nnukwu ọnụọgụgụ Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi jiri merie ya kwesịrị ikuziri ya na enwere mbe na abọ nke bụ oke.

Mbaka dọrọ ndị na-akatọ ya aka na ntị ka ha ghara itinye onwe ha na nsogbu nke chukwu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: