BBC Igbo at one: Ndị bịarala n'ọgbakọ BBC Igbo n'otu afọ

Maka ọrụọma anyị na-arụ, ndị anyị na-akpọ oku maka ndọrịtaụka, ịgba ajụjụọnụ na ihe ndị ọzọ, na-abịa aza anyị oku.

Nkọwa foto, Chimamanda Adichie bụ odeakwụkwọ a ma ama bịara ka anyị gbaa ya ajụjụọnụ
Nkọwa foto, Solomon Mugera bụ onyeisi BBC na mpaghara Afrịka sokwa na ndị anyị nabatarala n'ụlọọrụ anyị
Nkọwa foto, Emeka Opara na Kosi Udechukwu bịara soro anyị mee ndọrịtaụka n'ihe gbasara nwaanyị iketa ala na be nna ya
Nkọwa foto, Pamela Udoka, Chisom Ojukwu na Roseann Nwamaka bịara soro anyị mee mkparịtaụka gbasara di na nwunye ịma ego ole onye na-akpata
Nkọwa foto, Ebuka Obi-Uchendu e ji 'Big Brother Nigeria' mara, abịakutekwala
Nkọwa foto, BBC Igbo agaruola Lọndọn. Ndị Igbo na-akwado anyị bi na mba dị iche iche
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu bụ onye ndu ndị otu Ipob so na ndị aha ha na-ada ụda anyị zuterela
Nkọwa foto, Emeka Anyaoku bụbu odeakwụkwọ kachasị na ngalaba Commonwealth so na ndị kpọtụrụla anyị n'ụlọọrụ anyị
Nkọwa foto, Onye ntaakụkọ Chris Kehinde Nwandu a ma dịka CKN bịakwara soro anyị mee mkparịtaụka
Nkọwa foto, Jimmy Abia na Udo Agbarakwe bịara soro anyị mee mkparịtaụka gbasara Peter Obi na mgbajọ ntuliaka ndị Ipob
Nkọwa foto, Oby Ezekwesili bụ onye ihe gbasara ikike dịịrị onye na-amasị, abịkwala n'ụlọọrụ anyị
Nkọwa foto, Ugochukwu a ma dịka 'gala boy' maka inye ndị ụlọmkpọrọ gala ọ na-ere n'ụzọ, kpọtụrụ anyị
Nkọwa foto, Nnia Nwodo bụ onyeisi otu Ohaneze Ndigbo bịakwara n'ụlọọrụ anyị
Nkọwa foto, Otiegwu a ma ama bụ Tobechukwu Ejiofor nke a ma dịka "Illbliss" bịara kpọtụrụ anyị
Nkọwa foto, Ndị ọbịa anyị n'okwu 'Kedụ ihe ịchetara maka Agha Biafra'