Buhari visit to Lagos: Etu ndị mmadụ si nabata Onyeisiala

Ụgbọ achụmnta vootu Onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị otu pati APC bịarutere Legọs ụbọchị itoolu nke Febrụwarị 2019.

Nkọwa foto, Otu onye nwere ọrụsị yi uwe ndị APC ma jidekwa azịza bụ njirimara ndị pati a. Ọ na-eche ọbịbịa Onyeisiala Buhari

Ebe foto si, Bashir Ahmad

Nkọwa foto, Onyeisiala Buhari nọ n'ọgbọegwuregwu Teslim Balogun ebe ọ na-achụnta vootu maka ntuliaka ga-eme n'ụbọchị 16 nke ọnwa Febrụwarị 2019.
Nkọwa foto, Igwe mmadụ gbakọrọ na-eche ụgbọala bu onyeisiala n'ihu ọgbọegwuregwu Teslim Balogun dị na Legọs
Nkọwa foto, Ndị mmadụ gbakọrọ n'ọnụụzọ ọgbọegwuregwu Teslim Balogun ebe Onyeisiala Buhari nọ eme achụmnta vootu ya na Legọs
Nkọwa foto, Ọtụtụ oche tọgbọ chakoo n'ọgbọegwuregwu Teslim Balogun ebe Onyeisiala Buhari nọ achụnta vootu
Nkọwa foto, Ọtụtụ oche tọgbọ chakoo n'ọgbọegwuregwu Teslim Balogun
Nkọwa foto, Otu onye kubiri ume n'ogige ahụ. E tinyere ya n'ụgbọ nwịnwọ e ji ebu ndị ọrịa
Nkọwa foto, Echefukwala na ọ bụ ọgbakọ APC ka a na-eme ebe a
Nkọwa foto, Ndị nwere ọrụsị ekpeghị azụ n'ihe a na-eme
Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị Igbo na-akwado Onyeisiala Buhari pụtakwara n'ọgbọ