Plateau: Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-eru uju apụtala n'iwe

Ndị nne na ụmụnwaanyị ndị ọzọ na Platu steeti ejula n'okporo ụzọ ime ngagharị iwe gbasara mkpmkpa kpara na be ha.

Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị yi akwa uju pụta igosi na obi adịghị ha mma
Nkọwa foto, Ha na-ekwu na ha achọghị ogbugbu a na-egbu ha
Nkọwa foto, Ọbụghị naanị ndị nne nwaanyị pụtara ije a, ụmụagboghọ sokwa ha
Nkọwa foto, Ha na-akpọku ndị obodo ha niile ka ha bilie mee ihe ga-akwụsi mmemina a
Nkọwa foto, Obi mgbawa ha mere na ha na-akpọ onyeisiala mba Amerịka oku enyemaka
Nkọwa foto, Ndị pụtara ije ngagharị iwe a ruru otu puku mmadụ maọbụ karịa
Nkọwa foto, Ma nwoke ma nwaanyị, ewu na ọkụkọ niile pụtara
Nkọwa foto, Ndị e gburu ruru mmadụ 200 ebe e kwuru na ọ bụ naanị mmadụ iri na atọ ka a nwụchirila
Nkọwa foto, Ma n'anwụ ma na mmiri ozuzo, ha chọrọ ka a nụ olu ha
Nkọwa foto, Gọọmenti steeti ahụ kwuru na mmadụ 200 nwụrụ mana gọọmenti etiti na-ekwu na ọbụ 86
Nkọwa foto, Ha gbochiri ụzọ dị icheiche ebe ndị mmadụ na-agafe