Ihe mere m ji hapụ ụlọakwụkwọ 'Seminary' ma soro nzọmụkwụ nna m, Pericoma - Ebube Okoye (Diọkpara Pericoma)

Aha onyonyo, ‘Ihe mere m ji soro ụzọ ụkwụ Nna m hapụrụ’ - Ebube Okoye (Diọkpara Pericoma)

Otiegwu ama ama ọkachasị n’ala Igbo bụ Pericoma hapụrụ nwa ya bụ Ebube Okoye ụkpụrụ na ụzọ ya dịka ọ na-esosi ụzọ ụkwụ ya n’ike n’ike.

Maazị Okoye kọwara BBC etu o si echepụta nakwa etipụta egwu ọ na-eti ugbua.

Ebube bụ diọkpara Pericoma bụrụkwa onye ọtụtụ ne-etọ maka etu o si akwado omenala Igbo.

O kwuru na nna ya bu ‘Saint’ maka etu o si bịe ndụ ya.

Ọ kọwara ihe mere o ji hapụ ụlọakwụkwọ ọzụzụ pụrụiche nke ụkọchụkwụ bụ "Seminary" ma lọghachịte na iso usoro nakwa okpukperechi nke omenala.

Ebe foto si, Omor Perry

Nkọwa foto, Pericoma Okoye bụ otiegwu Igbo e ji ọdịnala mara

Onye bụ Pericoma?

Pericoma Okoye bụ onye am ama maka egwu ya nakwa etu o si kwadoo omenala Igbo nakwa okpukperechi ndị nnanna ya ha. Nke mere ụfọdụ ji gụọ ya “Arusi Makaja”.

O tinyere aka na-eme ka emume "Ikeji festival" dị ire n'Arondizuogu nke Imo steeti.

Ikeji emume iri ji a na-eme na mpaghara ahụ kwa afọ bido na ọnwa Maachị ruo ọnwa Eprel.

Ugbua, emume a abụrụla ihe na-adọtara steeti ahụ ọtụtụ ndị ọbịa nakwa na-akwalite akụnụba ha,.

Pericoma lara mmụọ n’afọ 2019.

Kirie ihe onyoonye a ka ịnụrụ ihe Ebube nwere ikwu maka nna ya nakwa ụzọ a ọ na-eso ugbua.

Ndị mere akụkọ a bụ Ebere Ekeopala na Chiemela Mgbeahuru.