Aju Mbaise: O nwere uru dị n'ịṅụ ọgwụ mgbọrọgwụ a?

Aha onyonyo, Gịni dị n'ime ajụ mbaise a

Ajụ Mbaise bụ mgbọrọgwụ na akwụkwọ si Mbaise n'Imo steeti nke ọtụtụ ndị Igbo ji esi ọgwụ a na-enye nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ.

Ndị na-aṅụ ya kwuru na ọ na-asacha afọ nwaanyị, wepụ ọbara ọjọọ fọrọ n'afọ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ma mee ka ọ takpọ.

Ụfọdụ sị na ọ na-agwọ ọrịa shuga nakwa ụfọdụ ọrịa ndị ọzọ.

Ahụmihe nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ gbasara Ajụ Mbaise

Nkọwa foto, Aju Mbaise nyeere m aka oge m mụrụ nwa ọhụrụ - Chinagorom Osuji

Chinagorom Osuji bụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ nke nne ya bịara ile ya ọmụgwọ ma wetara ya ọgwụ a bụ Ajụ Mbaise.

Nne Chinagorom bụ Regina Osuji gwara BBC Igbo na ya ji ọgwụ ahụ ga leta nwa ya nke mụrụ nwa n'oge gara aga.

"N'oge ahụ, nwa m nwaanyị ahụ na-enwe ụfọdụ nsogbu afọ dịka ọ mụchara nwa, mana oge ọ malitere ịṅụ ọgwụ a, nsogbu ndị ahụ hapụrụ ya," Regina kwuru.

Ọ kọwara na ọ bụkwa ndị mmadụ nyere ya ndụmọdụ gbasara ọgwụ ahụ mere o ji mata ya.

Nwa ya nwaanyị bụ Chinagorom gwakwara BBC na kamgbe ọ malitere ịṅụ ya bụ ọgwụ, na ya achọpụtala ụfọdụ ihe dị iche n'ahụ ya.

"O nyeere m aka ka ọbara ọjọọ ndị dị m n'afọ gbachapụ, mekwaa ka afọ m buru ibu gbadaa."

Mana kedu ihe ndị dokịnta chere maka ya?

Nkọwa foto, Ajụ Mbaise nwere ike ịrụ ọrụ, mana amaghị kpọmkwem ole nwaanyị kwesịrị ịṅụ ya ka ọ ghara ịṅụfe ya oke - Dkt Ngozi Obi

Mana Dọkịta Ngozi Obi bụ ọkachamara maka ahụike ụmụnwaanyị kwuru na ha anaghị adụ ụmụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ọdụ ka ha na-aṅụ ọgwụ mgbọrọgwụ.

Ọ kọwara na ọgwụ ndị a nwereike ịmetụta ụmụnwaanyị ahụ nakwa nwa ha n'ụzọ adịghị mma, kwukwaa na o nwere ike ịmetụta mmiri ara nwaanyị.

"Ahụ mmadụ nwere usoro nke ya oji ewepụ ọbara ọjọọ n'ahụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ," Dkt Ngozi kwuru.

Ọ gara n'ihu kwuo na Ajụ Mbaise nwere ike ịrụ ọrụ, mana amaghị kpọmkwem ole nwaanyị kwesịrị ịṅụ ya ka ọ ghara ịṅụfe ya oke.

"Ị ṅụfee ya oke, o nwere ike ịmetụta akịrị maọbụ umeji mmadụ," ka ọ kọwara.

"Onye ọbụla na-aṅụ ụmụ ọgwụ mgbọrọgwụ dịka Ajụ Mbaise na ndị ọzọ kwesịrị ịkpachapụ anya nke ọma.

Kirie akụkọ a n'uju n'ihe onyonyo dị n'elu.

Ndị mere ya bụ Uche Akaolisa na Chiemela Mgbeahuru.